Take a fresh look at your lifestyle.

A machiela ụgbọala nwere ‘tinted glass’ n’Enugwu Steeti

0 215

Gọọmentị Enugwu steeti amachiela ndị mmadụ ịnya ụgbọala glassị dị na mpo ha jiri nji a kpọrọ ‘tinted glass’.

Ha kwuru na nke a so na mbọ gọvanọ Peter Mbah nke steeti ahụ na-agba iji buo agha megide ndị omekaome na ndi ohi na steeti ahụ.

Akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ gọọmenti Enugwu bụ Chidiebere Onyia kwuru mmachi ahụ ga-adị ire malite n’ụbọchị 4 nke ọnwa Sepụtemba 2023.

Iwu a kwuru na a ga-ejichi ụgbọala ọbụla dara iwu a ruo mgbe ọ ga-ewepụ mpọ agwa oji ahụ ma kwụọ ụgwọ nha na-eso ya.

“Ọ dị mkpa ịmata na ihe mere e jiri tinye mmachi a bụ maka iji belata oke mpụ, ntọrị mmadụ nakwa ọrụ ndị omekaome n’Enugwu steeti”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *