Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onyeisiala Shettima Nọrọ N’isi Nzukọ Kansul Akụ Na Ụba

Cyril Okonkwo dere ya na bekee

0 480

Nzukọ mbụ nke National Economic Council nke Nigeria, (NEC) , n’okpuru nchịkwa nke Onyeisiala Bola Tinubu, malitere na Tọọzde na Presidential Villa ebe Osote onyeisiala Kashim Shettima nọrọ n’isi ya.

Nzukọ nke kansụl bidoro ka Onyeisiala Tinubu mechara mmalite ya.

Onye isi oche NEC bụ osote onye isi ala ma nwee ndị Gọvanọ nke steeti iri atọ na isii, Gọvanọ nke Central Bank of Nigeria na ndị ọrụ gọọmentị Naijiria ndị ọzọ dịka ndị otu.

Ndị Gọvanọ ọhụrụ a họpụtara na Maachị 18 ma wepụta ha na Mee 29 nke afọ a na-abịa nzukọ a nke mbụ ya.

Ha sonyeere Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti, Charles Soludo nke Anambra steeti, Duoyo Diri nke Bayelsa steeti, Abdullahi Sule nke steeti Nassarawa na Godwin Obaseki nke Edo steeti dịka ndị otu kansụl.

Gọvanọ ndị ọzọ bụ ndị otu kansụl tupu ọchịchị a bụ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti; Seyi Makinde nke Oyo; Yahaya Bello, Kogi Steeti ; Biodun Oyebanji, Ekiti; AbdulRahman Abdurazaq, Kwara; Babagana Zulum; Borno, Mai Buni, Yobe; Inuwa Yahaya, Gombe; Rotimi Akeredolu, Ondo; na Umar Finitri, Adamawa.

E hiwere National Economic Council site na ngalaba 153 (1) na Paragraf 18 na 19 nke akụkụ 1 nke usoro nke atọ nke iwu Naijiria 1999, ka emezigharịrị.

Kansụl na-ezukọ kwa ọnwa na-enye onye isi ala ndụmọdụ ihe gbasara akụ na ụba.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *