Ngagharịiwe kpụ ọkụ n’ọnụ na-aga n’ihu ugbua na mba Israel n’ihi mgbanwe nke aka na-achị mba ahụ bụ Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu chọrọ itinye n’usoro ikpe na mba ahụ.
Ihe kpatara ngagharịiwe nke a bụ ọchụchụ Netanyahu chụrụ Mịnịsta nchekwa mba Israel bụ Yoav Gallant, n’ihi na o kwuru okwu megide atụmatụ nhazigharị usoro ikpe ziri ezi na mba ahụ bụ nke Netanyahu chọrọ ime.
Mgbanwe a Netanyahu na-achọ itinye ga-enye ndị omeiwu ikike ịkụchapụ mkpebi ụlọikpe kachasị na mba Israel, mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụrụ na nke a gaa n’ihu ọ pụtara na ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ anwụọla.
Gallant kwuru na ọ dị mkpa ka Netanyahu gee ntị n’ihe ndị mmadụ na-ekwu ma hapụgodi mgbanwe ahụ ọ chọrọ ime, mana okwu ya mere ka Netanyahu chụọ ya n’ọrụ.
N’ihi nke a ka ọtụtụ mmadụ ji malite ngagharịiwe ma na-ekwu na ha anabataghị ọchịchị aka ike Netanyahu nakwa etu o si chọọ ịgbanwe usoro iwu ISrael naanị maka ọdịmma nke onwe ya.
Cheta na Netanyahu n’onwe ya nwere ebubo nrụrụaka nke ka na-aga n’ihu n’ụlọikpe.
Ndị uweojii ji egbe mmiri na ikuku ose chụsasịa ndị mmadụ gbakọrọ n’ihu ụlọ Netanyahu nakwa n’isi ụlọ omwieu mba Israel a na-akpọ Knesset.
N’ụtụtụ Mọnde, onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ n’Israel bụ Arnon Bar-David, akpọọla oke ka ndịọrụ malite abụbụọrụ na-egbughị oge.
Onyeisiala mba Israel bụ Isaac Herzog etinyekwala ọnụ kpọọ oku ka Netanyahu kwụsị mgbanwe ndị ahụ ọ chọrọ itinye n’usoro ikpe Israel.
Leave a Reply