Take a fresh look at your lifestyle.

Nke a bụ ekele e ji mara ndị Igbo.

CHIGO.

0 297

Ekele njirimara ndị Igbo -Nke a bụ ekele e ji mara ndị Igbo, ha ji enwe mmekọrịta karịsịa ma ha nọkọrọ ọnụ n’ime ọgbakọ dị iche iche.

I ji maa atụ bụ Chaa! Chaa!! Chaaa!!! Igbo kwenu! -Heee!

Mụọnụ – Heee! Zụọnụ – Heee! Rienu! – Heee! Kachaanụ – Heee!

Ekele oge ụbọchị – Ekele oge ụbọchị bụ ndị a na-ekele n’oge dị iche iche n’ụbọchị dịka n’ụtụtụ, n’ehihie nakwa n’abalị.

Iji maa atụ, “Ị bọọla chi?”; “Ị pụtala ụra?”; “Ụtụtụ ọma;” “Daalụ” Ehihe ọma, Ụhuruchi ọma, Ị batala ọrụ nke taa? Ka chi fo, Rahụ jụụ dgz.

Ekele ọrụ – Nke a bụ ekele ndị a na-ekele mgbe mmadụ na-arụ ọrụ, e nwekwara ike iji ya a gba mmadụ ume nke gụnyere Jisie ike, Ndewoo, Daalụ dgz.

Ekele ọrụ na-adịkwa iche site mpaghara Igbo dị iche iche. Ndị mpaghara Enugwu na-ekwu , ‘Dejee’, ndị Bende n’Abịa steeti na-ekele, “Jọkwa”, ebe ndị Ngwa na-ekele , “Maazị”.

Ekele njem – Ekele a bụ nke ndị Igbo na-atụpụrụ onye na-eme njem dịka “Ije ọma”, “E jee a lọọ”, “Ije awele”, “ka ọ dị”, “ka okporoụzọ rubere gị isi” dgz.

E nwekwara nke e ji a nabata onye si njem bata dịka “Ị lọtala?”, “Nnọọ” dgz.

Ekele nkasi obi – Ọ bụ ekele ndị Igbo ji akasi onye nwere otu ọdachi maọbụ nke ọzọ obi n’ihe dakwasịrị ya dịka “Kara obi”, “Diwe”, “Ndo”, “Gharawa” dgz.

Ekele nri – Nke gụnyere ekele a na-ekwe mgbe ndị Igbo na-eri nri maọbụ mgbe ha richara nri dịka; “Bịa rie nri”, I meela, I sie, Daalụ na nri ụtọ a dgz.

Ndị Igbo nwekwara ụzọ dị iche iche ha ji egosipụta ekele na-abụghị site n’okwu ọnụ nke gụnyere Ikwekọrịta n’aka, Ife aka, ịkụkọta akupe ( ndị ichie), ibi ọma, itu mmadụ aha na ndị ọzọ.

BBC

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *