Onye nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa bụ Mary Beth Leonard ekwuola na mpụtara ntụliaka onyeisiala Naịjirịa emere ejughị ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa afọ.
N’akwụkwọ ozi ọ depụtara ka Leonard kwuru sị, ” O doro mmadụ niile anya na ntụliaka nke e mere n’abali iri abuo na ise nke ọnwa Febụwarị ejughị ndị Naịjirịa afọ”.
Ọ gara n’ihu kwuo sị, “N’ụbọchị ndị na-abịa, ọ ga-adị mma ka ndị Naịjirịa gbochie ihe ọbụla ka ebutere ha oke maka ọdịmma Naịjirịa, kama ha hapụ ka iwu Naịjirịa kpezie ihe gbasara ntụliaka a”.
Leonard ji ohere a gwa Inec ka ha hazie nsogbu ọbụla sitere na ntụliaka ahụ tupu ebido ntụliaka nke abali iri na otu ọnwa maachị.
O kelekwara Peter Obi na Atiku Abubakar maka ịkweta iji usoro iwu Naịjirịa kpezie nsogbu ha ma Kele kwa Bola Ahmed Tinubu maka ịnabata ikike ha nwere ịga ụlọikpe.
Cheta na e mere ntụliaka onyeisiala Naịjirịa n’abali iri abuo na ise nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, nke Ngalaba Inec jiri kpọpụta Tinubu nke otu APC dịka onye meriri ya bụ ntụliaka.
Agbanyeghị nke a ndị dịka Peter Obi nke Labour Party na Atiku Abubakar nke PDP ha na ya soro zọọ ya bụ ọkwa sị na ha anabataghị ya bụ mpụtara.
Leave a Reply