Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Akwadola Mmụba Ọnụ Ego Ozi Ekwentị

0 304

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi Naijiria (NCC) akwadola arịrịọ sitere n’aka Mobile Network Operators (MNOs) ka ha welie ọnụ ego e ji eme nzikọrịta ozi ekwentị ihe ruru pasenti iri ise.  Mkpebi bịara n’ihi oke mmefu ego na-aga n’ihu nke ndị telcos chere ihu na mba ahụ.

N’ikwupụta mkpebi ahụ n’Abuja na Mọnde, Onye isi mmekọrịta ọhaneze na NCC, Dọkịnta Reuben Muoka, mere ka ọ pụta ìhe na mgbanwe ahụ dabeere na ikike nhazi nke kọmitii n’okpuru ngalaba 108 nke Nigerian Communications Act, 2003.

“Ndozigharị ahụ akwadoro bụ iji dozie nnukwu ọdịiche dị n’etiti ego mmefu na ego uru azụmahịa dị ugbu a ma hụkwa na e nyefere ọhaneze ọrụ dị mma. Dọkinta Muoka kọwara.

Mmụba tarifu a, nke e wegoro na pasentị iri ise, adaghị karịa Mmụba narị pasent nke ụfọdụ ndị ọrụ netwọk chọrọ na mbụ.

Agbanyeghị, Muoka kwusiri ike na ngbanwe ndị a ga-anọgide n’ime tarifu ndị e hiwere na NCC 2013 Cost Study na a ga-emejuputa ya n’otu n’otu n’ikwekọ na ntuziaka NCC ewepụtara ọhụrụ.

“Tarifu anọgidewo agbanwe agbanwe kemgbe afọ 2013, n’agbanyeghị ọnụ ahịa na-arịwanye elu nke ọrụ ndị ọrụ telecom chere ihu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *