Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Ezutela Osote Odeakwụkwọ UN

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 210

Onye isi ala Naijiria, Bola Ahmed Tinubu ezutela osote odeakwụkwọ ukwu nke United Nations, Amina Mohammed, bụ onye nọ na mba ahụ maka njem ọrụ ụbọchị abụọ.

Onyeisiala Tinubu nwere mkparịta ụka ya na UN DSG n’ụlọ ọrụ ya na Fraịde n’ụlọ ọrụ onye isi ala dị n’Abuja.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi mba, United Nations Information Center, Oluseyi Soremekun kwuputala na Tuzdee na osote ode akwụkwọ nke United Nations na Onyendu Naijiria ga-akparịta ụka dị oke mkpa dị ka nkwụdosi ike nke mpaghara nakwa mmepe.

Soremekun kwukwara na Mohammed “ga-esoro onye isi ala na ndị isi ọchịchị ndị ọzọ kparịta maka ọchịchị otu Economic Community of West Africa State”.

Mohammed sonyeere onye nnọchi anya onye odeakwụkwọ ukwu maka West Africa nakwa Sahel, Leonardo Simão na onye nhazi UN n”ime Naijiria, Mohamed Fall gaa ụlọ ọrụ Onyeisiala n’Abuja.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *