Onyeisiala Bola Tinubu ekeleela onye enyemaka ya Aide-de-Camp bụ ADC, n’aha mkpirisi, Col. Nurudeen Alowonle Yusuf, na mbulielu ya n’ọkwa nke ndị agha Naijiria.
Onyeisiala nọrọ na Tọzdee n’Abuja, kọwaa ADC ya, Col. Alowonle dị ka onye ọrụ a pụrụ ịdabere na ya, kwesịrị ibuli elu n’ọkwa.
Ndị agha Naijiria kwalitere Lt. Col. Yusuf ka ọ bụrụ Colonel n’abalị iri na itoolu ọnwa Disemba afọ 2024. Ọkwa ahụ malitere ịdị ire n’abalị iri abụọ na abụọ ọnwa Septemba 2023.
“Unu niile mara Nurudeen Alowonle Yusuf. Ọ na-ebu ọtụtụ ibu ọrụ. Obi dị m ụtọ na ndị isi ndị agha ebuliela ADC m n’ọkwa.
“O ruru eru inweta nkwalite ahụ, obi dịkwa m ụtọ maka ya. Nurudeen bụ onye ọrụ dị uchu na ntụkwasị obi nke nwere mmụọ ziri ezi. Ekwenyere m na ọ ga-aga n’ihu na ọrụ ya.
“Anyị nọnyeere gị. Anyị hụrụ gị n’anya ma na-eche banyere gị n’ezie. Anyị ga-anọgide na-eme otu ahụ. Agwa bụ ihe na-akọwa mmadụ, ọ kọwakwara gị. Site na nkwalite gị, a na-akwanyere gị ugwu. Site na obi m, ana m ekele gị. Anyị na-ekele Chineke maka gị.
“Ka Chineke gọzie ndị agha anyị ma chekwaa ha,” Onyeisiala kwuru.
Onye isi ala jara nwunye ADC mma maka “idebe ihu ụlọ kwụ ọtọ, dị jụụ na ntụkwasị obi” mgbe ọ na-ejere mba ahụ ozi.”
Col. Yusuf kelere onyeisiala maka ntụkwasị obi o nwere n’ime ya ije ozi dị ka Aide-de-Camp kemgbe ọnwa Mee 2023, na-ekwe nkwa iguzosi ike nye Onyeisiala nakwa obodo Naijiria.
“Eguzo m ebe a taa juputa na nnukwu ekele na ịdị umeala ka m na-atụgharị uche n’emume a dị ịrịba ama nke ịchọ m mma n’ọkwa onye agha Naijiria.
“Oge a bụ ihe dị ịrịba ama nke onwe na ihe akaebe maka ụkpụrụ nakwa nkwado na-enweghị atụ nke ndị gbara m gburugburu.
“Nke mbụ, a na m ekele Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile maka amara, nduzi, na ngọzi Ya n’ọrụ na ndụ m. E wezụga Ya, ụbọchị a agaghị ekwe omume.
“Nye Onyeisiala, nakwa onye isi ọchịagha, enwere m nkwanye ugwu dị ukwuu site na ohere e nyere m nkwalite n’ọkwa a dị egwu. Achọrọ m iji ohere a pụrụ iche kwughachi na onye ndu na ntụkwasị obi gị bụ isi iyi nke mkpali, na ije ozi dị ka Aide-de-Camp abụrụla nnukwu ihe ugwu na nsọpụrụ kachasị elu nke ọrụ m.
“Daalụ maka ntụkwasị obi gị n’ebe m nọ na maka ịnọ ebe a ikporo oke n’oge a pụrụ iche,” O kwuru.
Ndị nọ na mmemme ahụ bụ;
Gọvanọ Abdul Rahman AbdulRazaq nke Kwara State,
Onye ndụmọdụ ọrụ nchekwa mba Mallam Nuhu Ribadu,
Minista na-ahụ maka nchekwa steeti, Dr Bello Mohammad Matawalle,
Onye isi ndị ọrụ nchekwa General, Christopher Gwabin Musa,
Onye isi ndị ọrụ agha Lieutenant General Olufemi Olatubosun Oluyede, nakwa onye isi ọrụ uwe ojii, Kayode Egbetokun.
Leave a Reply