Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Akagbuola Ụtụ Isi N’ọrụ Telecom

Timothy Choji dere ya na bekee

0 348

Onyeisiala Bola Tinubu akwadola ka a kwụsị ụtụ Excise Tax pasentị ise na ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa.

Ọ kwadokwara ka nkwusioru nke Excise Duties na ngwaahịa ndị a na-emepụta na obodo Naijiria.

Onye ndụmọdụ pụrụiche nye Onyeisiala, Dele Alake kwupụtara nke a na nnọkọ ya na ndị nta akụkọ nke State House na Tọzdee.

Alake gwara ndị nta akụkọ na ndị a bụ akụkụ nke Iwu Executive anọ nke Onye isi ala bịnyere aka na ya.

O kwuru na e mere mkpebi a iji belata ahụhụ ndị Naijiria na-ata karịsịa n’ihe gbasara ịtụ ụtụ isi nakwa ime ka ndị ọchụnta ego obodo na ndị mba ọzọ nwee ohere oma nke azụmahịa.

Nkọwa ndị ọzọ na-abịa n’oge adịghị anya…..

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *