Ndị njem ala nsọ dị narị abụọ na iri asaa na abụọ maka njem Hajj 2023 si Kwara Steeti , mgbago ugwu Naijiria abatala n’udo.
Ndị njem ahụ si n’ọdụ ụgbọ elu nke Jeddah pụọ na mgbede Tuzdee site na Air Peace wee rute n’ọdụ ụgbọ elu Murtala Mohammed, Legọs ebe e mechara bufee ha n’ọdụ ụgbọ elu Ilorin International Airport na elekere 9:53 nke ụtụtụ ụbọchị Wenezde.
Ọ bụ onyeisi Imam nke Ilorin, Imam Mohammed Bashir, onye NAHCON Zonal Coordinator nke Kwara, Ondo na Ekiti Steeti, Ibrahim Fijabi na odeakwukwọ gọọmentị nke Kwara Steeti n’oge gara aga, Mamman Saba Jibril ndị duuru ndị otu batch mbụ a.
A ga-echeta na ndị njem ala nsọ 3,740 bụ ndi mere njem a site na Welfare Board nke steeti n’oge mmemme hajj nke afọ a sitere na steeti ahụ.
Emeela nhazi dị ngwa ngwa maka mbata ndị njem ala nsọ batch nke abụọ na ndị njem ndị ọzọ si steeti ahụ.
Leave a Reply