Onyeisi Sineti Agbaara Ndị Naịjirịa Ume Ikpe Ekpere, Ịtụgharị Uche N’Oge Lent
Lekan Sowande dere ya na bekee
Dịka ndị otu Kraịst ji taa bụ Ash Wednesday amalite emume Lent, Onyeisi Sineti nke Naijiria bụ Sinetọ Godswill Akpabio agbaara ndị otu Kraịst na Naịjirịa ume ka ha jiri oge ahụ dị ka oge ekpere na ntụgharị uche dị mma.
N’ozi onye ndụmọdụ pụrụ iche nakwa mgbasa ozi nye onye Sinetọ ahụ, Eseme Eyiboh wepụtara, ọdụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha cheta ọnwụ na mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi nakwa nchegharị.
Okwu ya: “Ka anyị na-ete ntụ, ka anyị cheta ọnwụ anyị na mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi na nchegharị.
“Ka oge a bụrụ oge maka inyocha onwe anyị, mgbaghara, na ime ka udo dị, na-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke na ibe anyị sikwuo ike.”
O kwere nkwa na, “N’aka anyị dịka ndị omeiwu, anyị ga-anọgide na-eme iwu ndị ga-akwalite ịdị n’otu, udo, na nghọta n’etiti ndị Naịjirịa niile.” “Ka Ndị Kraịst gburugburu ụwa na-eme emume Ash Wednesday, n’aha ezinụlọ m, ndị mebere obodo m, ndị Sineti na Ọgbakọ Mba nke Iri, ana m ekele unu niile nke ọma ma gọzie unu niile.”
“Ka Chineke gọzie anyị ma duzie anyị niile n’ụbọchị Ash Wednesday a na n’oge Lent niile,” Sineti Akpabio kwukwara.
Leave a Reply