Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Shettima Alọghachila Abuja Ka O Gasịrị Njem Ọrụ

Timothy Choji dere ya na bekee

0 215

Osote Onyeisiala Kashim Shettima alọghachila n’Abuja mgbe ọ gachara otu izu ụka o mere njem ọrụ n’obodo Guinea-Conakry nakwa Switzerland.

Osote Onyeisiala Shettima rutere n’ọdụ ụgbọ elu mba Naijiria bụ Nnamdi Azikiwe International Airport n’isi ụtụtụ Satọdee, abalị iri abụọ na anọ ọnwa Jenụwarị, mgbe ọ nọchitechara anya Onyeisiala Bola Tinubu n’emume idu n’iyi ọrụ nke Onyeisiala mba Guinea, Mamadi Doumbouya, nakwa idu ndị nnọchiteanya Naịjirịa gaa nzukọ kwa afọ nke World Economic Forum (WEF) n’obodo Davos.

O kwuru na Naịjirịa enwetala iru oche na mkparịta ụka atụmatụ na mpaghara ụwa dị iche iche.

Osote Onyeisiala ahụ gbakwụnyere na njem ahụ bụ akụkụ nke nkwa ọhụrụ nke Naịjirịa maka ịdị n’otu na mpaghara West Africa nakwa mkpebi ya imegharị akụnụba n’okpuru Renewed Hope Agenda nke Onyeisiala Tinubu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *