Take a fresh look at your lifestyle.

Naịjirịa na mba Afrịka ndị ọzọ ka a tụrụ anya na ha ga-enweta ego enyemaka.

Chigo deziri ya n'Igbo.

0 14

Nkesa enyemaka ego na Afrịka, nke European Commission kwupụtara,   ma wepụtara mmefu ego enyemaka izizi ruru €1.9 ijeri iji zaghachi nsogbu ụwa na-arịwanye elu.  Obodo ga=enweta ego ndi a gụnyere West na Central Africa, Sahel, Lake Chad Basin, North-West Naịjirịa, Central na Southern Africa, Mpaghara Great Lakes, na Greater Horn of Africa. Ego a anaghị etinye €14.6 nde dị iche iche e debere maka North Africa.

Dị ka EU Commission dị na Naịjirịa si kwuo, ọkwa a bịara n’oge a na-ahụ mmụba nke oke nrụgide n’ọrụ enyemaka mmadụ n’ụwa niile, ebe a na-atụ aro na ihe dị ka nde 239 mmadụ na-achọ enyemaka, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-enye ego mba ụwa na-ebelata nkwado ha.

Onye Kọmishọna EU maka Ikwu Ọha, Nkwadebe na Njikwa Nsogbu, Hadja Lahbib, kwuru na EU na-abanye n’oge dị oke mkpa iji kwado enyemaka na-azọpụta ndụ nye ndị kacha adịghị ike, ma na-achọkwa ịdọta ego sitere n’aka ngalaba onwe ya iji kwado ego ọha.

O

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *