Take a fresh look at your lifestyle.

A tụọla otu ọchịagha nga afo asaa maka izupu ego

0 254

Ụlọikpe ndị agha pụrụiche amaala otu ọchịagha ikpe maka izupu ego ruru ijeri naira atọ (3bn).

Ọchịagha Umaru Mohammed bụbu onye na-elekọta ngalaba ala na ụlọ nke ndị agha ga-aga nga afọ asaa maka nrụrụ aka na nzupu ego.

Ụlọikpe ahụ gwakwara Mohammed ya kwụghachi nde dọlla abụọ nakwa otu ijeri naira.

Ikpe mara ya n’ebube iri na anọ n’ime iri na asatọ gbadoro ụkwụ n’izupu ego nke e boro ya.

Onye okaiwu ya rịọrọ ụlọikpe ahụ ka ha kwe ka o nọọ oge ya na mkpọrọ nkịtị mana ụlọikpe jụrụ ajụ sị na ọ ga-anọ na mkpọrọ pụrụiche nke ndị agha.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *