Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe Mkpesa Ntuli Aka Onye Isi Ala Ga-Ebi Ikpe Na Wenezde

0 411

Ụlọ ikpe ntuli aka onye isi ala ekwenyela na Wenezdee, abalị isii ọnwa Septemba 2023, dị ka ụbọchị ibe ikpe maka arịrịọ atọ na-agbagha nsonaazụ nke ntuli aka onye isi ala afọ 2023.

Onye isi ndị na-edeba aha nke Ụlọikpe Mkpegharị, Maazị Umar Bangari, kwadoro ụbọchị ahụ nye ndị nta akụkọ ikpe na Mọnde.

Dị ka Bangari si kwuo, etinyela ihe niile iji hụ na ikpe dị na arịrịọ atọ a na-eche n’ihu ụlọ ikpe a ga-enweta ụsa na-enweghị ihe mkpọbi ụkwụ ọbụla.

Ha bụ akwụkwọ mkpesa nke onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke People’s Democratic Party (PDP), Abubakar Atiku; Otu Labour Party na onye na-azọ ọkwa onyeisiala ya bụ Maazị Peter Obi; na nke Allied People’s Movement (APM), bụ Princess Chi-Chi Ojei.

Bangari kwuru na etinyela nchekwa zuru oke na naanị ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọha mmadụ niile a kpọrọ òkù ka a ga-ahapụ ịbanye n’ime ụlọ ikpe.

Nke a, ka o kwuru, bụ iji zere mkpọkọ na mmegide nchekwa.

Ọ sịkwara na a ga-ahapụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi chọrọ ịgbasa na televishọn ikpe ahụ ka ha mee nke ahụ mana ọ gaghị efu ụlọikpe ego ọbụla.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *