Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Elu Adaala n’Abuja

Hudu Yakubu dere ya na bekee

0 373

Otu ụlọ okpukpu abụọ nke e ji mere ebe azụmahịa adaala na Garki District nke Abuja, isi obodo Naijiria n’abalị Wenezde.

N’ịkọwa ihe ndapụta a nye ndị nta akụkọ n’Abuja, onye isi ụlọ ọrụ Federal Emergency Management Agency, Dr Abbass Iddriss kwuru na a napụtala mmadụ iri atọ na asaa n’ebe ihe owuwu ahụ dara.
Dọkịnta Ididriss kwuru na ebupụla ndị ahụ ọ metụtara n’ụlọọgwụ dị iche iche n’Abuja.

Ọ gara n’ihu kwupụta na mmadụ abụọ merụrụ ahụ nke ukwuu.

Dị ka DG “A napụtala mmadụ iri atọ na asaa ma kpọga ha ụlọọgwụ, ebe e kwuru na ndị ọzọ ka tọrọ atọ.

“Ndị otu nnapụta na ndị ọzọ abanyela ọrụ. Ọrụ nnapụta na-aga n’ihu mana ọ na-egbu oge n’ihi mmiri ozuzo na-aga n’ihu.

Ọ gbakwụnyere, “Ha na-agbasi mbọ ike iji nweta igwe e ji egwupụta ihe iji zọpụta ndị mmadụ na mkpọmkpọ ebe ahụ”,

DG toro mbọ ndị niile nke a metụtara gbara, nke gụnyere ndị obodo, iji aka napụta ndị ahụ tọrọ atọ.

O kwupụtara na ọrụ nnapụta na-aga n’ihu ka ha na-eche ọbịbịa akụrụngwa iji kwalite ọrụ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *