Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Amerịka abụọ nwere agba si chọpụta na agbụrụ ha bụ Igbo.

CHIGO.

0 386

Ndị Amerịka abụọ nwere agba si chọpụta na agbụrụ ha bụ Igbo.

Ndị Amerịka abụọ bụ Emmitt McHenry na ọchịagha Williams E. Ward achọpụtala na nwere agbụrụ n’ala Igbo.

McHenry bụ onye chọpụtara akara (.com) e ji ezisa ozi n’ịntanetị ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ ‘Defense Manufacturing”, ebe Ward bụ onyeisiagha mbụ nke ndịagha mba Amerịka nọ ọrụ n’Afrịka (US.Africa Command) na Stuttgart nakwa Jamini n’afọ 2007.

Obi jụpụtara ụmụ Igbo ndị a n’ọṅụ dịka onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu nabatara ha n’emume e mere n’ụlọmmụta ‘Smithsonian Institute of African Museum’ dị na Washington DC nke mba Amerịka na nso nso a.

McHenry kwuru na nna ya gbaara ya na ụmụnne ya ama n’akwụkwọozi si n’aka ndị nna ha ochie rute ya aka gosiri na ha bụ ndị Igbo.

Ọ gara n’ihu kwuo na o meela nnyocha akụrụngwa ime a kpọrọ ‘DNA’ nke gosiri kpọmkwem na ọ bụ nwafọ Igbo akụghị mmiri.

McHenry na Ward yicha akwa isiagụ jiri ọṅụ pụta n’ọgbọ n’emume nnabata nke Ohanaeze Ndigbo meere ha.

Dịka ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnia si kwuo n’ozi o wepụtara, onyeisi Ohaneze bụ Iwuanyanwy gosiri obi ụtọ ya na ndị Amerịka si ala isiojii chọpụtara na ha si ala Igbo ma too ha maka mbọ ha na-agba n’Amerịka nke mere aha ji ada ụda.

BBC IGBO

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *