Take a fresh look at your lifestyle.

Anyị ga-ata Mmesoma Ejikeme ahụhụ maka ịkpụgharị mpụtara ule ya – JAMB

0 288

Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye na mahadum bụ Joint Admission and Matriculation Board (JAMB) ekwuola na ha ga-ata nwada Mmesoma Ejikeme ahụhụ maka igosi mpụtara ule nke adịgboroja n’ule nke afọ 2023.

Site n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Fabian Benjamin wepụtara, ha boro Mmesoma ebubu ịkpụgharị mpụtara o nwetere n’ule ahụ bụ nke o jiri nata onyinye agụmaakwụkwọ n’efu site n’aka ụlọọrụ Innoson na-arụ ụgbọala.

“Nwada Ejikeme Joy Mmesoma nwetere akara 249 ọ bụghị akara 362 dịka o siri kwuo.

“Ọ kpụgharịrị mpụtara ule UTME ya iji ghọgbuo ọha maka inwete nrite nturuugo nakwa ịgbọpụta ihe.”

JAMB gara n’ihu sị na ha ga-ewezuga ezi mpụtara Mmesoma nwetere n’ule ahụ, ma kwuo na ọtụtụ ụmụakwụkwọ ji mpụtara nke adịgboroja na-akpagharị nke ha ji ụfọdụ akụrụngwa ‘software’ rụọ.

Ụlọọrụ na-emepụta ụgbọala na Nnewi bụ Innoson Motors enyela nwada a ego agụmaakwụkwọ dị nde naịra atọ (N3m).

Ha gara n’ihu kelee ụlọọrụ Innoson maka onyinye a ma gwaa ndị ọzọ ka ha adala mba n’ihi agwa a nwada a kpara.

“Mmesoma zitere anyị ozi na ọ chọrọ ịhụ akara mpụtara ule ya mana tupu e wepụta ya, ọ gara kpụọ nke adịgboroja ma were ya dochie n’ihu akwụkwọ mpụtara ahụ nke afọ 2022, na-amaghị na anyị agbanweela etu ihu akwụkwọ mpụtara ahụ na-adị n’afọ 2023.

JAMB kọwara na ihe mere ha jiri chọpụta bụ mgbe onye ọrụ gọomentị Anambra Steeti kpọrọ ha n’ekwentị na-ajụ ma ọ bụ eziokwu na Mmesoma nwetere akara 362 n’ule UTME nke afọ 2023. Ha mere nyocha ma chọpụta na ọ bụ akara 249 ka o nwetere.

“Akara o nwetere bụ 249 o nweghi ihe ga-agbanwe ya. Site n’agwa Mmesoma kpara anyị ga-ewezuga mpụtara ule ya ma taa ya ahụhụ.

Cheta na nwada a wuru ewu n’izuụka ole na ole gara maka akara o nwetere n’ule JAMB nke mere ụlọọrụ Innoson jiri nye ya ego nrite nde naịra atọ (N3m).

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *