Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị mba Fransị na-atụle itinye ọnọdụ gbatagbata n’ihi ọgbaaghara na mbibi

0 305

A na-atụ anya na Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ga-akpọ ọgbakọ nke ndị isi ọchịchị mba ahụ iji tulee ma a ga-etinye ọnọdụ gbatagbata iji kwụsị ọgbaaghara na’aga n’ihu ugbua na mpaghara dị icheiche.

Nke a na-abịa dịka ọgbaaghara na mba Fransị banyere ụbọchị nke atọ ugbua dịka ndị uweojii gbagburu otu nwata nwoke aha ya bụ Nahel M, onye dị afọ 17 dịka ọ jụrụ ịkwụsị oge ndị uweojii na-ajụ ya ajụjụ n’okporoụzọ.

Ọtụtụ ndị mmadụ, tinyere onyeisiala Macron, akatọọla etu ndị uweojii si gbuo nwata nwoke ahụ ma kwuo na a malitela nnyocha maka ya, mana otu jikọrọ ndị uweojii kwuru na ọ dịghị mma etu onyeisiala si katọọ ndị uweojii na-echeghị ka mpụtara nnyocha ahụ pụta.

Osote onyeisi Sineti mba Fransị bụ Roger Karoutchi depụtara n’akara Twitter ya na ọ ga-abụ nnukwu mmehie ma ọ bụrụ na gọọmentị etinyeghị ọnọdụ gbatagbata

Ọnọdụ gbatagbata bụ akụrụngwa gọọmentị na-eji egbochi ọnọdụ ọbụla nwereike itinye mba ha maọbụ mpaghara ọbụla n’ihe egwu. ọ na-enye ndị ọrụ nchekwa ohere ịmachi mkpagharị n’ebe ụfọdụ ma gbochikwaa ndị mmadụ ịgbakọ ebe ọbụla.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụgbọala, ụlọahịa nakwa ụlọ dị icheiche, ọ kachasị nke ndị gọọmentị alaala n’iyi, dịka ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe na-agba ihe niile ha hụrụ ọkụ.

Mana akụkọ kwuru na ndị ekperima jikwa ohere ahụ na-awakpo ụlọahịa ndị mmadụ na-ebukọrọ ihe dị ebe ahụ.

Otu nwaanyị onye nwere ụlọahịa ebe ọ na-ere sịgaretị gwara ndi nta akuko na ya hụrụ ndị ntorobịa wakporo ụlọahịa ya n’abalị ụbọchị Mọnde, kpokọrọ sịga niile ọ na-ere.

Ndị uweojii sị na ha ejichiela ihe ruru mmadụ 667 bụ ndị so emebi ihe n’ọgbaaghara ahụ.

Onyeisiala Emmanuel Macron ahapụkwala ọgbakọ nke ọ na-esonye na ya n’obodo Brussels nke mba Belgium iji laghachi Fransị maka ọgbaaghara a.

Chetakwa na ọgbaghara dakwara na Fransị n’ọnwa Maachị afọ a, dịka gọọmentị wepụtara atụmatụ ọhụrụ gbasara ịkwụ ụgwọ ndị larala ezumike nka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *