Take a fresh look at your lifestyle.

“Gọọmenti bitere ụgbọelu Nigeria Air ahụ site n’aka ụlọọrụ Ethiopian Airlines”

0 640

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ Nigeria Air bụ Dapo Olumide kwuru na ụgbọelu ahụ gọọmentị ji mee ngosi bụ ụgbọelu e bitere n’aka ụlọọrụ Ethiopian Airlines.

Olumide onye kwuru nke n’isi kọmitii ụlọomeiwu na-ahụ maka njem ụgbọelu sị na e bughachịrịla ndị Ethiopian Airlines ụgbọelu ahụ dịka e kpughechara ya.

Onyeisi kọmitii ahụ bụ Biodun Olujimi gbarụrụ ihu ihe mere Hadi Sirika bụbu minista njem ụgbọelu jiri mee ngwa ngwa gosi ụgbọelu ahụ n’ụbọchị Onyeisiala Buhari na-arịtu n’ọkwa.

Onyeisi kọmitii ụgbọelu a n’ụlọomeiwu nta bụ Nnolim Nnaji kwuru na mkpughe ahụ bụ ihe aghụghọ.

Olumide kwuru na e mere mkpughe ụgbọelu Nigeria Air ahụ iji gwa ndị Naịjirịa na ụgbọelu ahụ abụghị akụkọ aja mbele.

Kedụ ihe kọmitii a kpebiri?

  • Ha kpebiri ka ministri na-ahụ maka njem ụgbọelu kagbuo atụmatụ ụlọọrụ Nigeria Air nakwa ihe ọbụla gbasara ya.
  • Ha gwara Onyeisiala Bola Tinubu ka o hiwe kọmitii ga-enyocha ihe ọbụla gbasara ụlọọrụ Nigeria Air nakwa ego ndị e mefurula na ha.
  • Ha kwuru na a ga-agba mbọ hụụ na a tara ndị niile aka ha dị n’aghụghọ ikpughe ụgbọelu Nigeria Air ahụhụ ruuru ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *