Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Omebe Iwu Nta Enyela CBN Iwu Ka Ọkwụsịtụ Amụma Ndọrọ Ego Ọhụrụ

Gloria Essien dere ya na Bekee

0 372

Ndị ụlọ omebe iwu arịọla Central Bank of Nigeria (CBN) ka ọ kwụsị imejuputa iwu ndọrọ ego ọhụrụ nke ga-adịba ire na abalị itoolu ọnwa Jenụwarị, 2023, ruo mgbe a na-akwadoro ya n’usoro iwu hibere ụlọ akụ ahụ.

Ụlọ omebe iwu ahụ kpọkuru Gọvanọ CBN, Godwin Emefiele dịka iwu nke Central Bank Act si kwuo ka ọ kọwaara Ụlọ Nzukọ ahụ ọtụtụ amuma ụlọ akụ n’oge na-adịbeghị anya.

Nke a bụ nsonazụ nke mkpesa nke gbadoro ụkwụ na “Mkpa Ọ dị Central Bank Ịkagbu Mkpebi Ya N’oke Ndọrọ Ego” nke onye otu ha sitere Jigawa steeti, Hon Magaji Aliyu kpaliri.

Ụlọ iwu ahụ kwuru na “na abalị isii nke onwa Disemba 2022, site n’akwụkwọ ozi nke akara ya bụ BSD/DIR/PUB/LAB/015/069, nke Haruna B. Mustafa (Onye isi na-ahụ maka ọrụ ụlọ akụ) binyere aka na ya nye ọha na eze, ihe ndị gụnyere:

Oke ndọrọ ego maka ndị mmadụ na ụlọ ọrụ kwa izu ga-abụ N100,000.00 na N500,000.00 n’otu n’otu. Ndọrọ ego gafere oke a ga-adọta ụgwọ nhazi nke pasent ise na pasent iri n’otu n’otu.

Akwụkwọ ndọrọ ego (cheque) nke gafere puku naira iri ise bụ nke agaghị akwụ mmadụ n’ime ụlọ akụ, ebe oke nde naira iri (N10,000,000.00) maka nchacha ego ka dị.

Ndọrọ ego kacha elu kwa izu ụka site na igwe ATM ga-abụ N100,000.00 nke pụtara N20,000 kwa ụbọchị.

Naanị akwụkwọ ego nke N200.00 na ndị pekariri ya ka a ga-etinye n’ime igwe ATM.

Ndọrọ ego kacha elu site n’igwe PoS ga-abụ N20,000.00 kwa ụbọchị.
.
N’ọnọdụ ndị siri ike, na abụghị ihe karịrị otu ugboro n’ọnwa, ebe ndọrọ ego agaghị agafe N5,000,000.00 na N10,000,000.00 maka ndị mmadụ na ụlọ ọrụ n’otu n’otu. Mkpali iwu kwuru

O kwuru na ọtụtụ ndị azụmahịa n’ime obodo bụrụkwa ndị na-akwalite akụ na ụba Naijiria karịsịa bụ ndị anaghị enwe mmasị iji usoro ụlọ akụ eletroniks maka azụmahịa ha n’ihi ọtụtụ n’ime agughi akwụkwọ”

O kwukwara na “Ọ gbagwojuru anya na ndị Naijiria a bụ ndị nkwalite akụ na ụba Naijiria ga-enwe mmetụta na-adịghị mma yana azụmahịa ha nwere ike imebi site na ntuziaka ọhụrụ a nke Central Bank nyere. Na-ewutekwa na ntuziaka a na-eme ka ọgba aghara dị ukwuu ma nye ndị nwe ụlọ ahịa dị ala nchegbu siri ike n’ihi ọkwa obere oge nke Central Bank of Nigeria (CBN) nyere.”

Ụlọ Omebe Iwu ahụ kwetara na Central Bank of Nigeria nwere ikike ịnye usoro ego gbasara akụ na ụba Naijiria ka o nwee ike iduzi akụ na ụba na akụkụ ziri ezi nke mgbake na uto.

Mkpebi Ụlọ Omebe Iwu

Ụlọ ịwụ ahụ kpebiri;
ịrịọ Central Bank of Nigeria ka ha kagbuo amụma a n’ihi ihe ọghọm ndị a e kwuru na mbụ.

ịrịọ Central Bank ka ha mekwuo nkwado, nkuzi na nghọta maka ndị na-azụ ahịa tupu ha ewepụta amụma na ntuziaka ndị nwere ike imetụta nchegbu azụmahịa ha.

inyefe kọmitii na-ahụ maka ụlọ akụ na ego ịhụ na a gbasoro mkpebi a”

Enwere iwe na Ụlọ ịwụ ahụ ka ndị otu ya na-akatọ amụma ndọrọ ego ọhụrụ ahụ, na-ekwu na ọ ga-emetụta obere azụmahịa na akụ na ụba ebe ọ bụ na ọtụtụ ime obodo enweghị ohere ịnweta ụlọ akụ.

Na nkabi okwu mkpesa a bụ ọkà okwu Hon Femi Gbajabiamila, nyere iwu ka CBN kagbuo amụma ahụ ma kpọkwaa nnukwu ụlọ akụ ahụ ka ọ bịa n’ụlọ iwu ahụ n’ụtụtụ Tọzdee izu ụka na-abịa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *