Take a fresh look at your lifestyle.

Etu onye kwesịrị ịbụ ‘MC’ n’ọgbakọ Labour Pati n’Owerri si nwụọ na mberede

0 389

Chukwunonye Irouno kwesịrị ịbụ onye ‘MC’ n’ọgbakọ achụmnta vootu nke ndị ‘Labour Pati nwere n’Owere, Steeti Imo n’ụbọchị Tuzde, mana n’abalị ụbọchị Mọnde ka ọ nwụrụ na mberede.

Irouno bụkwa onye na-azọ ọkwa onye omeiwu ga-anọchite okpuruọchịchị Okigwe n’ụlọ ndị omeiwu nke Imo steeti.

Dịka otu enyi Irouno si kọọrọ onye ntaakụkọ anyị, na mgbede ụbọchị Monde ka Irouno na ụfọdụ ndị isi Labour pati n’Imo steeti gara lelee ogige ebe a ga-anọ nwee ọgbakọ ịchụnta vootu n’ụbọchị Tuzde.

Chukwunonye Irouno kwesịrị ịbụ onye nhazi n’ọgbakọ ịchụnta vootu nke Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na Labour Pati

“Oge ọ laruru ụlọ, ọ gwara nwunye ka o butere ya nri abalị tupu ọ banye n’ime ụlọ ka ọ saa ahụ. Mana oge o rutere nso n’elu aka ya, omume ya gbanwere,” nwoke ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru.

“Ihe nke a gbagwojuru anya. Nwoke a bụ onye kwesịrị ịhazi ọgbakọ achụmnta vootu ọkwa onyeisiala nke Labour pati n’Owerri. Ọ nwụrụ nkeji olemole ọ gwachara nwunye ya ka o tinyere ya nri.”

N’agbanyeghị ọnwụ Irouno, ọgbakọ achụmnta vootu ndị Labour Pati gakwara n’ihu, mana ndị mmadụ ji otu nkeji kwanyere ya ugwu na ya bụ ọgbakọ.

Onye bụ Chukwunonye Irouno

  • Chukwunonye Irouno bụ onye Arondizuogu nke mpaghara Okigwe
  • Ọ gụrụ akwụkwọ mahadum na Mahadum Port Harcourt
  • Ọ rụburu ọrụ dịka ‘Councillor’ nọchitere anya ‘ward’ ya n’okpuru ọchịchị Okigwe n’oge ọchịchị Gọvanọ Achike Udenwa
  • Ọ rụkwara ọrụ dịka onye enyemaka gọvanọ Imo steet n’okwu gbasara ịkpa obi ọma, nakwa na mgbasa ozi
  • Irouno rụkwara ọrụ dịka onye enyemaka mgbasaozi nye Benjami Uwajumogu na Acho Ihim, oge mmadụ abụọ ahụ bụ ndị isi ụlọ omeiwu Imo steeti
  • Ọ bụkwa onye enyemaka nye Frank Ibezim bụ Sinetọ na-anọchi anya mpaghara Okigwe ugbua. Ọ bụ n’ọrụ a ka o si gbaa arụkwaghịm ịbịa zọọ ọkwa omeiwu n’ụlọ omeiwu Imo steeti

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *