Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari na-achọ ka ndị omebe iwu Senate kwado ọkwa atọ

0 499

Onyeisiala Muhammadu Buhari, arịọla ndị ụlọomeiwu sineti ka ha kwadoghachi nhọpụta ya ọzọ osote gọvanọ abụọ nke Central Bank of Nigeria (CBN). Ha bụ; Oriakụ Aisha Ndanusa Ahmad, na Mr. Edward Adamu, ndị nhọpụta ha bụ maka oge nke abụọ na nke ikpeazụ.                                                     Arịrịọ Onyeisiala Buhari dị n’akwụkwọ ozi o degaara ndị sinetọ nke Sinetọ Ahmad Lawan, onye isi oche ndị sinetị Naijiria gụpụtara na Tuesday.               Onye isi ala na-arịọkwa ndị sineti ka ha kwado nhọpụta ya nke Ambassador Ayuba Jacob Ngbako, dịka onye otu Revenue Mobilisation Allocation and Fiscal Commission RMAFC, na-anọchite anya FCT.                                                                                                                                                                              Ego mmefu ego FCT 2023 Ewezuga nhọpụta ndị a, Onyeisiala Buhari ezipụla ndị sineti, 2023 Appropriation Bill of the FCT maka nleba anya na ntinye.                                                                                                                                                                                                                                                                   A na-atụ anya na ndị omebe iwu Sineti ga-ezukọ n’ụlọ ezumezu n’ụbọchị Wenezde a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *