Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Uwe Ojii Nwetara Otuto Maka Ịzọpụta Ndị A Tọọrọ

Eme Offiong

0 362

A jaara ndị uweojii Naịjirịa mma maka ịzọpụta mmadụ asatọ a tọọrọ na steeti Cross River dị na ndịda ugwu Naịjirịa.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Ọkammụta Ben Ayade kelere ndị uwe ojii Naịjirịa ngalaba nke Cross River maka ịnapụta mmadụ asatọ n’ime mmadụ itoolu a tọọrọ.

N’abalị iri na ise n’ọnwa Nọvemba nke afọ 2022, ndị omekome tọọrọ ndị njem itoolu n’ụgbọala abụọ na-eme njem n’okporo ụzọ si Calabar gaba Ikom na steeti ahụ.

Gọvanọ Ayade, onye nwere ọmịiko ebe ndị ahụ anapụtara nọ, katọrọ mwakpo na ntọrọ ndị njem ahụ,ma kwupụta na ya katọrọ nke ukwuu mwakpo na ntọrọ ndị njem n’okporo ụzọ si Calabar jee Ikom.

Ọ gara n’ihu kwuo, “Anyị nwere ekele maka ọrụ nnapụta emegoro, nke ka na-aga n’ihu. Anyị agaghị ekwe ka omume mpụ dị otú a gbanye mkpọrọgwụ na steeti anyị ebe anyị kpebisiri ike ịhụ na ihe a mere bụ nke ikpeazụ ya n’ala anyị. Obi mwute anyị na-eru ebe ndị mmadụ ndị a na ndị ezinụlọ ha nọ n’ihi ajọ mpụ a dakwasịrị ha.”

Gọvanọ Cross River kwuru na dịka steeti hụrụ udo n’anya, gọọmentị na-agba mbọ iji chekwaa ụmụ amaala ya ma kwalite nnyocha ime oke ọhịa nile dị na gburugburu ya, bụ nke jezuru okpuru ọchịchị dị asatọ na steeti ahụ.

Ịkwalite Ọrụ Nchekwa

Ayade gosiri na ụlọ ọrụ nchekwa a kpọrọ Homeland Security bụ nke steeti hibere ebe ndị na-achụ nta ga-eso nye aka nlekọta ime ọhịa Uyanga.

Ọ sịrị, “Anyị arịọọla gọọmentị Naịjirịa arịrịọ ka ha tinyekwuo ndị agha n’ime ọhịa Uyanga nke dị n’okpuru ọchịchị Akamkpa yana itinye ụgbọ elu Tucano n’ọrụ.

Ọ gbakwụnyere na steetị ahụ ga-azụtakwa egbe ụgbọ mmiri na ụgbọ ala iji chekwaa elu mmiri na okporo ụzọ dịka ha tinyere igwe nchekwa (Automatic Security System) n’ụzọ batara Calabar.

Ọ rịọrọ udo na nkwado site n’aka ndị Naijiria bi na steeti Cross River.

 

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *