Take a fresh look at your lifestyle.

Kọmitii Mgbata Ụgwọ Chọrọ Ka Amachibido Ndị Oji Ugwọ

Cyril Okonkwo

0 436

Otu kọmitii e hibere maka ịgbata ụgwọ nke e ji ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe onwunwe nke Naijiria nke a kpọrọ Asset Management Corporation of Nigeria (AMCON), tụrụ aro na site ugbu a gaa n’ihu, a gaghị ekwe ka ndị niile ji ụlọ ọrụ ahụ ụgwọ soro n’azụmahịa ma ọ bụ soro ụlọ ọrụ gọọmentị ọbụla nweta nkwado ọbụla, ma e wezụga inweta akwụkwọ ikike sitere n’AMCON.

Onye isi oche nke kọmitii ahụ, Prof. Bolaji Owasonoye tụrụ aro a na Tuzdee mgbe o du ndi otu ya inyefe osote onye isi ala, Yemi Osinbajo, ozi nchọpụta.

N’ịgba ume ka e mejuputa iwu ndị dị mkpa gụnyere iwu AMCON, Owasonoye siri ọnwụ na e kwesịghị ikwe ka ndị ji ụgwọ na-erite uru n’ọrụ ngo nke gọọmentị ma e wezụga inweta akwụkwọ ikike nke AMCON.

“N’agbata afọ 2020 na 2021, AMCON gbatara ụgwọ nke ukwuu nke e gosipụtara na akwụkwọ ozi nchọpụta ahụ. N’ime oge a na-enyocha, AMCON hụrụ uto mgbata ụgwọ pasent iri”.

“Dịka ọmụmaatụ, n’afọ 2020, enwetara ego ruru ijeri otu narị naira na iri anọ na isii, ebe n’afọ 2021 nwetakwara ego ruru ijeri otu narị naira iri isii na otu. E nwere ezi olileanya igbata nnukwu ụgwọ n’afọ 2022 ebe kọmitii ahụ agaghịkwa ada mba n’ọrụ. ”

Onye isi oche ahụ gara n’ihu kwupụta na kọmitii ahụ malitere ọrụ ozugbo eguzobere ya, mana ọbịbịa nke ọrịa Covid-19 zuru ụwa ọnụ mere ka ọ nwee ihe mkpọbi ụkwụ.

Ka ọ na-anabata akwụkwọ ozi ahụ, Ọkammụta Osinbajo kwuru na gọọmentị ga-enyocha ma tinye ya n’ọrụ.

Ọrụ dịịrị kọmitii a, nke eguzobere na Septemba afọ 2019 gụnyere nnyocha ọnọdụ ụgwọ e ji AMCON, ịchịkọta ozi
gbasara ndị ji ụgwọ dị iche iche na ọnọdụ ha ugbu a. Ịtụgharị uche, atụmatụ na usoro nke iwu kwadoro maka ịgbata ụgwọ na ndị ọzọ.

Ndị otu Kọmitii a mejupụtara ndị nnọchiteanya sitere na ụlọ ọrụ gọọmentị dị iche iche gụnyere Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission; Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe onwunwe nke Naijiria bụ Asset Management Corporation of Nigeria, Mịnịstrị Ikpemkwụmọtọ nke Naijiria, Nigeria Financial Intelligence Agency, Nigeria Deposit Insurance Corporation, Central Bank of Nigeria, Department of State Services nakwa Economic and Financial Crimes Commission.

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *