Take a fresh look at your lifestyle.

Novak Djokovic apụọla mba Australia

0 469

Mịnịsta na-ahụ maka nbata na ọpụpụ na mba Australia bụ Alex Hawke ekwuola na ọpịa Tenịsị mba ụwa bụ Novak Djokovic apụola mba ahụ ugbua.

N’ozi ya o dere “A nabatara m mkpebi ụlọikpe ‘Federal Court’ nke mba Australia”.

Hawke ji ikike ya dịka Mịnịsta kagbuo akwụkwọ ikike njem Djokovic ịnọ na mba ahụ dịka o kwuru na mkpebi a bụ maka ọdịnma na ahụike ndị mba Australia.

Mba Australia ga-agbara Novak Djokovic ụgbọ nwa mkpi isi mba ahụ pụwa ozugbo dịka ha anabataghị mkpesa ya gbasara nkagbu akwụkwọ njem ya.

Ọkaikpe atọ kwekọrịtara ịgbajọ mkpesa ahụ ma kwuo na ha ga-agwa ụwa ihe mere ha ji kpebie ikpe ahụ etu ahụ n’oge na-adịghị anya.

Novak Djokovic mgbe ọ na-apịa tennis n’asompị 2022 Australian Open na Melbourne, Australia.

Ndị na-kwado Djokovic gbarụrụ ihu maka mkpebi ọhụrụ a ndị ọkaikpe ụlọikpe dị na mba Australia mere maka ịchụpụ nwa amadị ahụ.

Na mbụ, ndị nkwado Djokovic nọ n’ihu ụlọikpe ebe e mere mkpebi ịchụpụ ya aghọtachaghị mkpebi a mana mgbe ha ghọtara ya , obi gbawara ọtụtụ n’ime ha.

Gịnị ka mkpebi ọhụrụ a pụtara?

Dịka abalị iri gafechara kamgbe ikpe Djokovic malitere. ọkaikpe atọ enyela mkpebi nke ikpeazu gbasara nwa amadi ahụ na mba ahụ isonye n’asọmpi Australia Open.

Nke a gosiri na mkpebi ọkaiwu Alex Hawke bụ ọkaiwu na-ahụ maka ndị mbiarambiara kwụ chịm.

Ọ pụtakwara na enwerike ichụpụ Djokovic bụ ọkaibe n’asọmpị ụmụnwoke na-apia tennis na mba ụwa ma machie ya ịbanye mba Australia ruo afọ atọ.

O gaghị enweta ohere ịrịọ ka ekpegharịa ya bụ ikpe tupu egwu mbụ ya echi bụ Mọnde.

Djokovic edepụtala na ọ gaghị arịọ ka ekpegharịa ikpe ahụ.

A hazigharịala etu asọmpị ‘Australia open 2022’ nke monde ga-esi gaa

Ugbua ọ bụ na Djokovic ga-esi mba Australia pụọ, ọ gaghị eso na asọmpị nke Mọnde.

Djokovic na Miomir Kecmanovic bụkwa onye Serbia kwesiburu ịsọkọta mpi na Mọnde, Jenụwarị 17 2021.

Mana ọ bụzi Salvatore Caruso, onye Italy ma bụrụkwa onye nke otu narị na iri ise na bọọlụ tennis na mba ụwa ga-anọchite anya Djokovic na Mọnde.

Iwu asọmpị ukwu kwuru na ọkaibe ọbụla gbajọrọ udiri egwu tennis dịka ewepụtechara usoro etu egwu Mọnde si gaa ga-eme ka onye achitaghị aja n’egwu ndị agbagoro agba sonyekwa n’asọmpị.

Lee ka Djokovic si rute ebe ọ nọ ụgbua n’okwu a

Djokovic ji aka ya kwupute na Jewnuari 4, 2022, na o nwetala ohere isonye n’asọmpi tennis nke a ga-eme na Melbourne, Australia.

Mba Australia na-ekwu ka ndị mbiarambiara ọbụla gbaa ọgwụ mbochi ugboro abụọ maọbụ nọpụ iche ruo abalị iri na anọ.

Mana Djokovic na-agbabeghị ọgwụ mgbochi depụtra na soshal media na ya enwetala ikike igbajọ nyocha ndị ahụike.

Ihe ahụ o kwuru kpalitere okwu dịka ọhaneze malitere kwuwe maka mgbajọ ahụ.

Ọkaiwu na-ahụ maka ndị mbiarambiara akpọrọ Alex Hawke kagburu akwụkwọ njem ofesi Novak Djokovic n’ụbọchị Jenụwarị 5, 2022 ma kwuo na o ji ọnọdụ ahụike ya enye ndị bi na mba Australia nsogbu.

Ndị ọkaiwu Djokovic anabataghị mkpebi ahụ, ha mara ya aka n’ihu ọkaikpe atọ n’ụlọikpe etiti nke mba Australia taa.

Ndị ọkaikpe ahụ nyochara ya bụ mkpesa taa bụ Jenụwarị 16, 2022 ma kpebie n’ikpeazụ na Djokovic ga-esi mba Australia pụọ.

Na mbụ n’ụlọikpe, gọọmenti Australia kwuru na ekwenyeghị na ọgwụ mgbochi covid Djokovic ga-enye ndị mba ha nsogbu.

Mana ndị ọkaiwu Djokovic kwuru na onweghị ihe akaebe gosiri ebubo ahụ.

Ha kwukwara na gọọmenti echemighị echiche maka nkewa nchụpụ Djokovic na mba ha ga-ebute.

Djokovic onye laghachiri na ebe ejichiri ya n’ụbọchi satọde- nwetere ohere ị ga otu ebe o si e gere etu ikpe ya si aga.                                                                      

Igwe C./BBC

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *