Take a fresh look at your lifestyle.

Aga eme ntuliaka nke okpuru ọchichi n’Steeti Cross River afọ ọzọ 

0 362

Ụlọ ọrụ n’ahụ maka ntuliaka n’Steeti Cross River nke akpọrọ,Cross River State Independent Electoral Commission, CROSIEC,egosiputala njikere ha ime ntuliaka nke okpuru ọchichi ime obodo n’abali iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee afọ 2023.

 Onyeisi oche Commission a bụ, Dr. Mike Ushie mere ka amata nkea mgbe yana ndi nnọchite anya otu ndọrọndọrọ nakwa ndi otu n’azọ oke ruru onye na Calabar bụ isi obodo nke Steeti a mpaghara South-south nke Naijiria.

Ushie kwuru n’ihe mere mee ka amata maka nkea bụ ka ndi otu ndọrọndọrọ jiri kwado nke ọma maka ntuliaka a.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na, “Nkea bụ iji ruwe isi nye iwu Section 28, subsection 1 nke afọ 2022 Electoral Act dika amaghariri ya,nke kwuru ka eme ka amata otu afọ tupuu eme ntuiliaka.

“Ihe nile banyere ntuliaka malitere taa bụ abli iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee afọ 2023,dika emeworo ka amata ubochi ntuliaka n’Steetia,”

Ushie gwara ndi otu ndọrọndọrọ ka gba mbọ hụ n’enwere ezi ntuliaka elu nke okpuru ọchichi na Steeti Cross River.

“Anyi ga eweputa usoro aga eji eme ntuliaka bụ nke ndi otu ndọrọndọrọ ọbụla ga eruwe isi nye.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *