Take a fresh look at your lifestyle.

Kọmitii Ụlọ Omeiwu Ga-Enyocha Anaghị Akwụnye Ego Ezumike Nka nke FCT

Gloria Essien dere ya na bekee

0 294

Ndị kọmitii ụlọ omebe iwu na-ahụ maka Federal Capital Territory (FCT) Area Councils and Ancillary Matters ekwupụtala atụmatụ ha inyocha enweghị ike nke kansụl mpaghara isii ahụ inyefe Area Council Staff Pension Board ego ezumike nka.

E mere mkpebi a n’oge nzukọ dị n’etiti kọmitii ahụ na ụlọ ọrụ dị iche iche n’okpuru ikike ya.

Onye isi oche kọmitii ahụ, Hon. Fred Agbedi, gwara ụlọ ọrụ ọ metụtara ka ha weta akwụkwọ ndekọ zuru oke nke ego nbipute ezumike nka maka nyocha.

Ọ gwara onye odeakwụkwọ ka o degara ndị kansụl mpaghara niile akwụkwọ ka ha nye kọmitii ahụ ndekọ maka ego ezumike nka ha nyefere n’aha ndị ọrụ ha.

Maazị Abedi gbakwụnyere na kọmitii a ga-amalite ileba anya na mmefu ego nke ụlọ ọrụ niile.

Onye isi oche nke Board, Suleman Abdulrahman, pụtara n’ihu kọmitii ma gwa kọmitii na ego a na-enyefe anaghị abụkarị mgbe dum .

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *