Ogbunigwe a tụrụ site na Yemen adaala n’akụkụ ọdọụgbọelu Izrel bụ Ben Gurion airport.
Ndị ọchịchị kwuru na nke a kpọtụrụ n’ụtụtụ Sọnde.
Onyonyoo fesara n’ịntanetị nke a maghị ndị sere ya dị ka o gosiri ebe ndị ọkwọụgbọala kwụsịrị n’akụkụ ụzọ izere isi ha oge ogbunigwe ahụ dara.
A hụkwara nnukwu anwụrụ ojii n’akụkụ ọdọụgbọelu ahụ dị na mpụga Tel Aviv.
Ụlọmgbasaozi Izrel sị na ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ogbunigwe ahụ merụrụ mmadụ anọ ahụ ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ha na-agbaga ebe ha ga-ezere isi ha
N’ozi o wepụtara, Minista na-ahụ maka nchekwa n’Izrel bụ Israel Katz kwuru sị: “Onye ọbụla tiri anyị otu ugboro, anyị ga-eti ya ugboro asaa”.
N’ozi a gbasara n’ụlọmgbasaozo tivii, ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Houthi bụ Yahya Saree kwuru na ọdọụgbọelu Izrel “enweghịzi nchekwa maka njem ụgbọelu”.
Leave a Reply