Take a fresh look at your lifestyle.

Peter Obi akatọọla etu e siri kpụrụ VeryDarkMan n’otu ụlọ akụ

0 156

Onye ji bu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 bụ Peter Obi akatọọla etu e siri jide nwoke aha ya bụ Martin Vincent Otse a maama dịka VeryDarkMan (VDM).

Peter Obi bụ onye mere ka a mata nke a n’akara soshal mịdịa ya kọwara na ihe dị etu ahụ na-arụtụ aka n’ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya, ime ihe iwu kwadoro nakwa ọnọdụ ikike dịrị mmadụ na Naịjirịa.

N’okwu Peter Obi “a maara m na ndị ọrụ nchekwa nwere ikike ị kpụrụ mmadụ, mana ụzọ e siri kpụrụ Martin Vincent Otse a maama dịka VeryDarkMan (VDM) bụ nke na-etinye ụmụ amaala Naịjirịa niile n’ọnọdụ mmegharị anya”.

Peter Obi dọrọ aka na ntị sị “Ọ ga-abụ ihe ịgba anya mmịrị ma ọ bụrụ na ndị Naịjirịa amaghịzị ihe dị iche mgbe ndị ntọ tọọrọ mmadụ na mgbe ọ bụ ndị ọrụ nchekwa kpọọrọ onye ahụ”.

Obi kwuru na ihe dị etu a na-emetụta akụnụba Naịjirịa ma na-ebutere Naịjirịa ajọ aha n’ihu mba ụwa niile.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *