Ụlọọrụ na-ahụ maka ule eji abanye mahadum na Naịjirịa bụ ‘Joint Admission and matriculation Board (JAMB)’ ekwuola na ule Unified Tertiary Matriculation Examination (UTME) nke afọ a bụ 2025 ga-amalite n’ụbọchị Tọzde abali iri abuo na ano nke onwa Eprel.
Ozi onye na-ahụ maka mgbasa n’ụlọọrụ ahụ bụ Fabian Benjamin wepụtara n’akara sọshịa midia ndị JAMB, kwuru na mmalite ule ahụ agaghị a bụzi Fraịde abali iri abuo na ise nke onwa Eprel maka ihe ndị ozọ dị mkpa nke ụlọọrụ ahụ na-eme.
Benjamin gwara ụmụakwụkwọ ndị ga-esonye na-ule ahụ ka ha gaa n’ihu bipụta ‘Slip’ nke nwere ozi dị mkpa gbasara nkọwa ule ha.
Ọ gụpụtat ozi ndị ahụ dịka ụbọchị ụle ahụ, ebe ọ ga-anọ ele ule, oge na ihe ndị ọzọ dị oke mkpa.
Ọ gara n’ihu ịdọ ụmụakwụkwọ aka na ntị ka ha jiri n’oge bipụta akwụkwọ ule ha ‘slip’ nke ga-enyere ha aka iji kwado maka ịga ebe ha ga-ele ule ha.
O kwukwara na ọ dị oke mkpa n’ụmụakwụkwọ gara maara ebe ha ga-anọ ele ule ọbụlagodi otu ụbọchị maọbụ abụọ tupu ụbọchị ule.
Benjamin kwuru na o nweghị nwa akwụkwọ aga etinye ebe abụghị n’obodo ebe ọ chọrọ ịnọ ele ule ha.
Leave a Reply