Onyeisiala Tinubu Ahọpụtara Onyeisioche Nakwa Ndị Otu National Assembly Service Commission
Temitope Mustapha dere ya na bekee
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwadola nhọpụta Dọkịta Savior Enyiekere ka ọ bụrụ onyeisioche nke National Assembly Service Commission (NASC) maka afọ ise e nwere ike ịgbatịkwu.
Nkwupụta nke ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Maazị Bayo Onanuga binyere aka, gosiri na Onyeisiala Tinubu kwenyekwara nhọpụta ndị ọrụ kọmishọna abụọ sitere na mpaghara geopolitical zone.isii.
Ruo oge nhọpụta ya, Dọkịnta Enyiekere bụ ọkachamara n’ihe gbasara gburugburu ebe obibi bụ osote onye isi ndị ọrụ na onyeisi ụlọomeiwu Sineti.
Ndị otu iri na abụọ a họpụtara na kọmishọna ahụ sitere na mpaghara geopolitical zone isii gụnyere
NORTH WEST:
Suleiman Othman Hunkuyi
Hon. Yusuf A. Yusuf Tabukaqq
NORTH EAST:
Aminu Ibrahim Malle
Alhaji Lawan Maina Mahmud
NORTH CENTRAL:
Mark Hanmation Tersoo
Salihu Umar Agboola Balogun
SOUTH WEST:
Hon. Taiwo Olukemi Oluga
Hon. Afeez Ipeza-Balogun
Ndịda Ọwụwa Anyanwụ:
Hon. Dr. Nnanna Uzor Kalu
Festus Ifesinachi Odii
SOUTH SOUTH:
Patrick A. Giwa
Oriakụ Mary Ekpenyong
Onyeisioche nakwa ndị otu Kọmịshọn a ga-anọgide n’ọrụ afọ ise nke enwere ike ịgbatịkwu.
Leave a Reply