Take a fresh look at your lifestyle.

Nwunye Onyeisiala Eruela Ụju Onye Isi Ndị Agha Nwụrụ Anwụ Ma Letakwa Ezinaụlọ Ya.

Timothy Choji dere ya na bekee

0 439

Nwunye onye isi ala Naijiria, Oluremi Tinubu egosipụtala obi mwute dị ukwuu maka ọnwụ nke onye bụbu onye isi ndị agha, LeiutenantTaoreed Lagbaja, onye nwụrụ n’abalị Tuzdee na Legos.

N’ozi o wepụtara na Wenezde, Nwunye onye isi ala toro agwa ọma nke onye isi ndị agha nwụrụ anwụ.

Ọ sịrị: “Ọ bụ na nnukwu obi mwute ka m nwetara akụkọ ọjọọ banyere ọnwụ onye isi ndị agha bụ Lt. General Taoreed Lagbaja.

“N’ime oge ọrụ ya niile, Onye isi ndị agha nwụrụ anwụ gosipụtara ike, ịhụ mba n’anya, na nraranye na-enweghị mgbagha n’ijere obodo anyị anyị hụrụ n’anya ozi. Ana m ekesa ozi iti aka n’obi nye nwunye ya bụ Oriakụ Mariya Abiodun Lagbaja, ụmụntakịrị ya, ndị ezi-na-ụlọ, ndị enyi na ndị otu ọrụ ya.

“Ka Chineke pụrụ ime ihe niile kasie ha obi ma nye ha obi ike iburu ihe ụfu a na-enweghị atụ.

Ka mkpụrụ obi ya dị nwayọọ zuru ike n’udo zuru oke.”

Nwunye onye isi ala, Oluremi Tinubu gakwara nleta nkasi obi nye ezinaụlọ onye isi ndị agha Lt. General Taoreed Lagbaja.

Nwunye onyeisiala bụ nwunye osote onye isi ala Hajia Nana Shettima na nwunye onye ndụmọdụ nchekwa obodo bụ Hajia Zara Ribadu sonyeere ya. Nwunye onyeisi ndị ọrụ nchekwa bụ Oriakụ Oghogho Musa nabatara ha.

Ka ọ na-akasi nwunye onye nwụrụ anwụ bụ Oriakụ Mariya Abiodun Lagbaja na ụmụntakịrị ya obi, Oriakụ Oluremi Tinubu kwuru na “naanị Onyenwe anyị pụrụ ikpebi mgbe mmadụ ga-anwụ.”

Ọ gbara ha ume ka ezigbo ndụ na ihe nketa ọ hapụrụ kasie ha obi.

Oriakụ Tinubu gbara ụmụaka ahụ ume ka ha nọgide na-elekwasị anya ma na-agbaso echiche nna ha biri maka ya.

Onye isi ndị agha, Lt. General Taoreed Lagbaja nwụrụ na Tuzdee, abalị ise ọnwa Nọvemba, mgbe ọ rịasịrị ọrịa. Ọ gbara afọ iri ise na isii.

Lt. General Lagbaja nwụrụ anwụ jere ozi dị ka onye isi ndị agha Naịjirịa site n’ọnwa Juun afọ 2023 ruo ọnwa Nọvemba, afọ 2024.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *