Onyeisiala Tinubu Enyela Iwu Ka Eweghachi Ọkụ Eletrik Na Mpaghara Ugwu Naijiria
Temitope Mustapha dere ya na bekee
Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu enyela iwu ka Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ na ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa ka ha mee ngwa ngwa iji weghachi ọkụ eletrik na steeti mgbago ugwu nke ahụ metụtara.
Onye isi ala nwere mwute gbasara akụkọ mmebi na ịma ụma ala akụrụngwa ọkụ na ihe ndị ọzọ nke ọha na eze n’iyi nke kpatara ọnọdụ enweghị ọkụ ọha na eze.
Na nkwupụta nke onye ndụmọdụ pụrụ iche nye onye isi ala n’ihe gbasara mgbasa ozi na atụmatụ, Maazị Bayo Onanuga, binyere aka na ya, kwuru na Onye isi ala na-agba mbọ ugbu a iji kwụsị enweghị ọkụ nke na-akpagbu ọrụ mmekọrịta ọha na eze na akụ na ụba nke mpaghara ahụ.
O gosikwara nchegbu banyere enweghị ọkụ na mpaghara ugwu Naijiria n’ime ụbọchị ole na ole gara aga ma nyezie onye ndụmọdụ nchekwa obodo bụ Mallam Nuhu Ribadu ntụzi aka ka ya na ndị agha nakwa ndị agha ụgbọ elu rụkọọ ọrụ iji wepụta ndị ọrụ nchekwa zuru oke, iji chekwaa ndị injinia na-edozi ụdọ nnyefe ọkụ mebiri emebi.
Na nzụkọ ya na Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ eletrik, Maazị Adebayo Adelabu, bụ onye kọwapụtara mgbalị ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka nkesa ọkụ nke Naijiria (TCN) mere iji rụkwaa ụdọ nkesa ọkụ nke Shiroro-Kaduna mebiri emebi, Onye isi ala nyere ntụziaka maka ngwọta tọrọ atọ nye nsogbu ahụ.
Ọ nyekwara ndị injinia TCN ntụzi aka ka ha ghara ịla azụ n’iwetara ndị chọrọ ọkụ eletrik enyemaka ọsọ ọsọ iji kwado ọrụ mmekọrịta ọha na eze na akụ na ụba ha.
Onye isi ala rịọrọ ndị eze ọdịnala, ndị isi obodo, na ndị isi ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu ka ha na ụlọ ọrụ nchekwa rụkọọ ọrụ iji chekwaa akụrụngwa ọha na eze.
O kwuru na gọọmentị agaghị anabatakwa ụma mebie ma bibie akụrụngwa ọha na eze.
Leave a Reply