Take a fresh look at your lifestyle.

Ọka Okwu Ekwela Nkwa Imelite iwu Ntuli Aka Maka Afọ 2027

Gloria Essien dere ya na bekee

0 296

Onyeisi ụlọ omebe iwu Naijiria bụ Hon. Abbas Tajudeen, ekwuola na Ụlọ omebe iwu nke iri ga-arụ ọrụ iji wepụta usoro ntuli aka ka mma nke ga-eme ka ntuli aka dị mma n’afọ 2027.

Ọkà okwu Abbas kwuru na Ụlọ Nzukọ ahụ achọpụtalarị akụkụ ụfọdụ n’ime iwu ntuli aka nke kwesịrị ịgbasi ike tupu oge ntuli aka ọzọ.

Ọkà okwu ahụ mere ka a mara ihe ndị a mgbe ọ nabatara ndị nnọchiteanya nke European Union n’ime Naijiria na Economic Community of West African States nke onye nnọchiteanya EU na Nigeria, bụ Ms Samuela Isop, duziri n’ụlọ ọrụ ya n’Abuja na Tọzdee.

Ụlọ Omeiwu nke itoolu tụlere iwu ntuli aka nke afọ 2010, were nweta iwu ntuliaka nke afọ 2022 nke e tinyere n’ọrụ maka ntuli aka afọ 2023.

N’agbanyeghị, Ọkà Okwu kwuru na nnyocha ọzọ nke Iwu dị ugbu a ga-arụpụta ezigbo nsonaazụ na ntuli aka 2027.

Ọkà okwu Abbas, bụ onye natara ndị nnọchiteanya ahụ na ụlọ ọrụ nke ọtụtụ ndị otu ụlọ ahụ, kwukwara
n’okpuru nduzi ya ga-eme ike ya iji wepụta iwu iji gbaa ụmụ nwanyị na ndị ntorobịa ume itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọkà okwu Abbas, onye natara akwụkwọ akụkọ EU maka ntuli aka Naijiria 2023, kwuru na a ga-eji nlezianya mụọ ha.

Ndị ọzọ nọ n’otu EU bụ osote onye isi ndị nnọchianya, Maazị Zissimos Vergos; Onye ndụmọdụ gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, Maazị Osaro Odemwingie; Onye njikwa mmemme Democracy and Good Governance, Nwada Laolu Olawumi, na onye ndụmọdụ mgbasa ozi, Modestus Chukwulaka.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *