Take a fresh look at your lifestyle.

Emume Lent: Kpee Ekpere Maka Naijiria – Nwunye Onyeisiala Gwara Ndị Otu Kraịst

Timothy Choji dere ya na bekee

0 293

Dị ka ndị otu Kraịst nọ na Naịjirịa na-esonyere ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’ofe ụwa were mee emume oge Lent, nwunye onyeisiala nke mba ahụ, Oluremi Tinubu, enyela ha ka ha na-ekpe ekpere maka ụmụ ha na nke mba nile.

Ọ gbara ndị nwere akụ na ụba ume ka kwado ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’obodo.

“Dịka anyị na-amalite oge Lent n’ebu ọnụ na mgbaghara mmehie, ka anyị tụgharịa uche n’otú anyị ga-esi tụgharịa akwụkwọ ọhụrụ, maka ọdịmma anyị, ọdịmma ezinụlọ anyị, obodo anyị na mba anyị dum.

“Anyị bụ ndị Naijiria bụ ndị na-emesapụ aka, ndị na-ahụ n’anya ma ugbu a bụ oge inwe ọmịiko n’ebe ndị nọ na mkpa nọ.

Ọ sịrị, “Ugbu a bụ oge anyị niile ga-etinye aka na uto nke ndị mmadụ na mba anyị,” ka o kwuru.

Oriakụ Tinubu kwuputara olile anya na Chineke ga-anabata aririọ nke ndị na-esonye n’emume oge Lent.

“Ka Chineke nara arịrịọ anyị niile, n’aha Jizọs.

“Chineke gọzie Rịpọblik nke Naijirịa,” ọ gbakwụnyere.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *