Gọọmenti Naijiria na-ekwu na ọ ga-ewepụta atụmatụ ụzọ mba dị afọ iri maka mmepe igwe obodo na atụmatụ afọ atọ maka ụlọ ọrụ nsicha igwe bụ Ajaokuta Steel Complex iji mee ka ngalaba ahụ dịghachi ndụ.
Mịnịsta na-ahụ maka mmepe igwe nke mba ahụ, Shuaibu Audu bụ onye kwuru nke a na nnọkọ mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ nọ n’Abuja isi obodo mba ahụ, kwuru na Ministri na-anọgide na-elekwasị anya n’ịzụlite ngalaba ahụ.
O kwuru na atụmatụ mba ahụ kwekọrọ na Renewed Hope Agenda nke Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu iji gbanwee akụ na ụba.
“Onyeisiala Tinubu kepụtara Mịnịstrị a n’ọnwa Ọgọst afọ gara aga iji megharịa ngalaba nsicha nchara igwe.”
Onye Minista ahụ gosipụtara na ya na ndị mmekọ mmepe na-ekwurịta otú kacha mma Ụlọ ọrụ Ajakuta Steel Industry na National Steel Industry nwere ike isi mee nke ọma.
O kwuru na ụbara ọnatarachi dị n’ime ala nke Naijiria pụrụ imezigharị ọnọdụ akụ na ụba mba ahụ na ịgbasa uru nke ọchịchị onye kwuo uche ya nye nwa amaala ọ bụla na-agbakwụnye na mba ahụ dị njikere ibute ụzọ n’ngalaba nsicha igwe n’ụwa nile.
N’otu aka ahụ, odeakwụkwọ na-adịgide adịgide nke Mịnịstrị ahụ bụ Oriakụ Mary Ogbe kwuru na mba ahụ nwere ihe niile ọ ga-ewe iji kwalite ngalaba nsicha nchara igwe.
Leave a Reply