Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Ahọpụtala Ndị Otu Bọọdụ Njem Nsọ

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 232

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwadola nhọpụta Colonel Aloche Adole, dịka onyeisi oche Christian Pilgrim Commission Board, NCPC.

Onye isi ala na nkwupụta nke onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi, Ajuri Ngelale binyere aka, kwadokwara nhọpụta nke Dọkinta Stephen Adegbite ka ọ bụrụ odeakwụkwọ kọmịshọn nakwa Omowumi Olubunmi Ogunlola, onye na-anọchite anya South West na Bọọdụ ahụ.

Ndị ọzọ a họpụtara bụ; Clement Alobu Nweke, Onye otu, South East, Prince Weli Wosu, Onye otu, South South.

Onye isi ala Tinubu họpụtakwara Prọfesọ Joseph Haruna Mamman – Onye otu, North West, Dọkinta Toma Hamidu Ragnjiya – Onye otu, North East, Dr. Simon Abu Samson Dolly – Onye otu, North Central na Bishop Raphael Benjamin Nwankwo – onye nnọchiteanya nke Christian Association of Nigeria (CAN)

Ọ gwara ha ka ha hụ nhọpụta ha dị ka ohere ijere mba ahụ ozi.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *