Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Agha Naịjirịa Anwụchiela Ndị Otu Ha Dị Na Mmetọ Megide Ndị Nkịtị

Nokai Origin dere ya na bekee

0 236

Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha achọpụtala ma nwụchie ndị agha abụọ ahụ aka ha dị na mmetọ arụrụala ndị nkịtị na steeti Rivers, na vidiyo gbasara ebe nile na soshal midia.

Nkwupụta nke osote onye isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze, 6 Division, Lieutenant Colonel Danjuma Jonah kwuru na Headquarters, 6 Division, Nigerian Army hụrụ agwa ọjọọ ahụ na mwute nke mmadụ abụọ n’ime ndị ọrụ ha tinyere aka na ya.

Ngalaba ahụ kwuru n’ezoghị ọnụ na “Ndị agha Naijiria na-anọgide na-abụ ndị ọkachamara na-arụ ọrụ ya na-agbaso iwu nke njikọ aka na nkwanye ùgwù maka isi ihe ruuru mmadụ nke ụmụ amaala, n’ihi ya, ọ dịghị ụdị mmebi iwu a ga-akwado site na ndị ọrụ na-ezighị ezi.”

General Officer Commanding (GOC), 6 Division, Nigerian Army bụkwa onye na-ahụ maka Land Component Commander, Joint Task Force, South-South Nigeria, Operation DELTA SAFE, Major General Jamal Abdussalam enyela iwu ka e mee nnyocha zuru oke ozugbo.

GOC gakwara n’ihu mesie ọha mmadụ obi ike na ha ga-agbaso iwu nile na inye ntaramahụhụ megide ndị nke a metụtara.

Ya mere, ndị agha Naijiria gbara ndị ọha na eze nwere ezi uche ume ka ha gaa n’ihu na-enye ozi ziri ezi na n’oge kwesịrị ekwesị gbasara omume rụrụ arụ dị otú ahụ, ebe Ngalaba na-adị njikere na-anabata ndị mmadụ.

O kwusiri ike na ihe a mere bụ nke na-adịghị mma nke a ga-eleba anya ngwa ngwa.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *