Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onye Ọka Okwu Kalu Eruela Ụjụ Gọvanọ Ezeife

Gloria Essien dere ya na bekee

0 423

Osote onye ọka okwu ụlọ omebe iwu, Rt. Hon. Benjamin Okezie Kalu akwaala arịrị ọnwụ onye chịburu Anambra steeti bụ Dọkịta Chukwemeka Ezeife.

Na nkwupụta nke onye isi mgbasa ozi ya, Maazị Levinus Nwabughiogu, Kalu kwupụtara mwute maka ọnwụ Ezeife bụ gọvanọ n’etiti afọ 1992 na 1993.

O kwuru na Ezeife bụ onye na-ekwuwapụta okwu n’ihe gbasara mmekọrịta ọha na eze na Naịjirịa oge ọ dị ndụ.

Osote ọka okwu ahụ kwuru na Ezeife bụ otu onye na-agaghị egbu anya nkụ n’ikwu okwu ọ bụla site na nkwenye na nkà ihe ọmụma ya.

Kalu kwupụtara ihe ntinye nke okenye ahụ a ma ama, onye bụkwa onye ndụmọdụ onyeisiala nye Prezidenti Olusegun Obasanjo n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ gbakwụnyere na Ezeife nwụrụ anwụ na-ekwukwa okwu maka udo na ịdị n’otu n’etiti ndị Igbo na ndịda ọwụwa anyanwụ Naijiria.

Na nkasi obi nye ezinụlọ ya, ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị enyi ya, osote onye ọka okwu kpere ekpere maka ezumike nke mkpụrụ obi Ezeife.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *