Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe Kasị Elu Na-Amalite Ikpe Na Ntuli Aka Onyeisiala

Salihu Ali dere ya na bekee

0 474

Ụlọikpe Kasị Elu nke Naijiria na-ekpe ikpe maka mkpegharị nke onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke Peoples Democratic Party, PDP, Atiku Abubakar, na nke Labour Party, LP, Peter Obi, gbara megide mmeri nke President Bola Tinubu nke All. Progressives Congress, APC, na ntuli aka nke abalị iri abụọ na ise ọnwa Febrụwarị.

Onye bụbu osote onye isi ala na Obi na-agbagha ikpe nke ụlọikpe mkpesa ntuli aka onye isi ala, PEPC nke kwadoro nhọpụta onyeisiala Bola Tinubu.

Otú ọ dị, Atiku na Obi, bụ ndị bịara nke abụọ na nke atọ, n’otu n’otu, jụrụ omume INEC na ntuli aka; dịka ha boro ebubo aghụghọ na ntuliaka zuru ebe niile na enweghị ikike nke Maazị Tinubu na osote onye isi ala Kashim Shettima ịzọ ọkwa onyeisiala.

Ugbua ndị otu mmadụ asaa nke Justice Inyang Okoro nọ na-agụ akwụkwọ ikpe Atiku Abubakar gbara.

A na-agbasa ihe omume ụlọ ikpe kacha elu dị ka onye ọka ikpe Naijiria (CJN), Justice Olukayode Ariwoola kwuru, na mkpebi a ga-abụ mkpebi ikpeazụ n’esemokwu maka ntuli aka ahụ.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *