Take a fresh look at your lifestyle.

 NNUKWU IDE MMIRI NA MBA GHANA.

CHIGO.

0 442

NNUKWU IDE MMIRI NA MBA GHANA.

Nnukwu Idei mmiri etochiela ụlọ ọtụtụ mmadụ na mpaghara Tongu na mba Ghana, ma  mee ka ọtụtụ ndị mmadụ gbaa ọsọ ndụ.

Ngalaba gbatagbata nke mba ahụ bụ ‘National Disaster Management Organisation (Nadmo) kwuru na ha na otu enyemaka ndị ọzọ na-agba mbọ ugbua ịọpụta ndị ka nọ na mpaghara ahụ ebe ideimmiri tojuru.

Nke a mere dịka ngalaba ‘Volta River Authority’ kwuru na ha mepere ọdọ mmiri abụọ, bekee kpọrọ ‘hydroelectric dam’, bụ ‘Akosombo’ na Kpong ka mmiri gbajuru na ha wụpụtụ.

Osote onyeisi Nadmo bụ Sedzi Sadzi kwuru na opekatampe mpaghara itoolu dị na Volta nakwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ ka ideimmiri a metụtara.

Ebe ọ kacha njọ bụ na mpaghara Ugwu, Etiti na Ndịda Tongu.

“N’ebe ndị a, ideimmiri tojuru obodo ha niile, okporoụzọ ha niile ekpochapụkwala,” Sadzi kwuru.

Ọ sị na ha bụ nd Nadmo na-agba mbọ ịkpọga ndị mmadụ n’ebe dị icheiche e wepụtara dịka ebe obibi nchereoge maka ndị ọdachi a metụtara.

BBC

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *