Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Ahọpụtala Jamila Bio Na Olawande Ka Ha Bụrụ Ndị Minista Na-Ahụ Maka Ndị Ntorobịa

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 435

Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu akwadola nhọpụta Dọkịta Jamila Bio Ibrahim ka ọ bụrụ onye minista na-ahụ maka ndị ntorobịa, ruo mgbe ndị Sineti nke Naijirịa kwadoro ya.

E mere ka a mara nke a na nkwupụta nke onye ndụmọdụ pụrụiche nye Onye isi ala na mgbasa ozi, Ajuri Ngelale binyere aka.

Onye isi ala kwadokwala nhọpụta Mazị Ayodele Olawande ka ọ bụrụ onye obele minista na-ahụ maka ndị ntorobịa, ruo mgbe ndị Sineti nke Naijiria kwadoro ya.

Dọkịnta Jamila Bio Ibrahim bụ dọkịta na-ahụ maka ahụike ma bụrụkwa onye isi nso nso a dị ka onye isi oche ọgbakọ ndị ntorobịa na-aga n’ihu (PYWF).

Ọ rụkwara ọrụ dịka onye enyemaka pụrụiche nye Gọvanọ Kwara State na Sustainable Development Goals (SDGs).

Maazị Ayodele Olawande bụ ọkachamara n’ịkwalite mmepe obodo na onye ndu ntorobịa n’ọchịchị All Progressives Congress (APC).

Ọ rụkwara ọrụ n’oge na-adịbeghị anya na Ọfịs Onye Ndụmọdụ Pụrụ Iche nye Onye isi ala na Innovation site n’afọ 2019 ruo 2023.

Onyeisiala Tinubu nyekwara ndị minista ahụ a họpụtara ọhụrụ ọrụ ka ha hụ na ha na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi ọhụrụ, na ịrụpụta ihe na-adịghị agwụ agwụ bụ nke ndị na-eto eto na Naijiria na-eme ka ha na-arụ ọrụ ha.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *