Take a fresh look at your lifestyle.

Zute Gọvanọ Ọhụrụ Nke CBN Dọkịnta Yemi Cardoso

0 452

Profaịlụ Nke Dọkịta Yemi Cardoso

Dọkinta Yemi Cardoso bụ nwa amaala Lagos Steeti nke South-west Naijiria.

Ọ gara ụlọ akwụkwọ Corona Ikoyi na St. Gregory’s College, Lagos maka agụmakwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị.

Ọmụmụ akwụkwọ mahadum ya nwetara nzere bachelọ (B.Sc.) na Mahadum Aston, nke United Kingdom n’afọ1980.

Ọ gara n’ihu na agụmakwụkwọ ya na Harvard Kennedy School of Government (HKS), ebe ọ nwetara akara ugo mmụta Master na Public Administration n’afọ 2005, dịka onye otu Mason.

N’ịkwado ọrụ ya pụtara ihe na ngalaba nkeonwe na nke ọha, Mahadum Aston nyere ya nzere Doctorate na nchịkwa azụmahịa (Doctorate of Business Administration, honoraris causa) n’afọ 2017.

Ọ bụkwa onye otu nke Chartered Institute of Stockbrokers, n’etiti ọtụtụ nzere ndị ọzọ.

Dị ka onyeisi oche nke Board of Directors of Citibank Nigeria, Dọkịnta Yemi Cardoso bụ ọkachamara n’ihe gbasara ego na mmepe nke ruru ihe karịrị afọ iri atọ na ahụmahụ ndị ọzọ na ngalaba nkeonwe, na nke ọha na eze.

N’afọ 1999, a họpụtara Yemi dịka onye kọmishọna mbụ maka atụmatụ akụ na ụba na mmefu ego nke steeti Legos.

N’ime ikike a, o dere ma nyochaa mmejuputa ụkpụrụ nke na-akwalite mmepe akụ na ụba na megacity nke isii kachasị n’ụwa nile.

Ọ rụkwara ọrụ na bọọdụ ọtụtụ ụlọ ọrụ gụnyere Texaco na Chevron Oil Plc.

Dọkinta Cardoso bụ onye so na Belgian Cities Alliance Think Tank, nke na-agba mbọ ịkpụzi na imetụta amụma na mkpebi ime mmepe obodo n’Africa ma nwee mmekọrịta siri ike ya na ndị isi na-enye onyinye na mba ụwa.

Nrara ọ raara onwe ya nye mmụta ogologo ndụ ya emeela ka onweta amara site na ụlọ ọrụ dị iche iche, gụnyere ndị a:

•Trustee of Harvard club of Nigeria site afọ 2022 ruo ugbu a

• Onye nlekọta ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Harvard Kennedy na Naijirịa site n’afọ 2020 ruo ugbu a

• Onye ndụmọdụ Board nke Lagos Business School site na 2019 ruo ugbu a

•Trustee of St. Augustine University site 2018 ruo ugbu a

• Onye otu Board nke Harvard Kennedy ahọpụtara n’ụwa niile site na 2006 ruo 2010.

Onye isi ala Bola Tinubu akwadola nhọpụta Dọkịta Olayemi Cardoso ka ọ bụrụ Gọvanọ ọhụrụ nke Central Bank of Nigeria (CBN), maka afọ ise (5) na mbido mbụ, ruo mgbe ndị ụlọomeiwu Naijiria kwadoro ya. .

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *