Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Na UAE Edoziela Okwu Mmekọrịta Mba Ma Maghepu Mmachi Visa

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 263

Onye isi ala Naijiria, Bola Ahmed Tinubu na Onye isi ala United Arab Emirates, Mohamed bin Zayed Al Nahyan, emechaala nkwekọrịta, nke mere ka a kwụsị ngwa ngwa nke mmachibido iwu visa etinyere ndị njem Naijiria.

Site na nkwekọrịta a, ụlọ ọrụ njem ụgbọelu Etihad na nke Emirates ga-amaliteghachi usoro njem ụgbọ elu na Naijiria ozugbo, n’egbughị oge ọzọ.

E mere ka ndị a mara n’akwụkwọ ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nye onyeisiala n’ihe gbasara mgbasa ozi na ọhaneze bụ Chief Ajuri Ngelale binyere aka.

Nkwupụta ahụ gbakwụnyere na iweghachi ọrụ ụgbọ elu ozugbo, site na ụgbọ elu abụọ na n’etiti mba abụọ ahụ, anaghị agụnye ụgwọ ọ bụla gọọmentị Naịjirịa ozugbo.

Ndị isi abụọ ahụ kwenyekwala na usoro nke ga-agụnye ọtụtụ ijeri dollar US, uru nke itinye ego ọhụrụ n’ime akụ na ụba Nigeria n’ọtụtụ akụkụ, gụnyere nchekwa, ọrụ ugbo na ndị ọzọ, site na ntinye ego nke Gọọmenti United Arab Emirates.

Nkwupụta ahụ gbakwụnyere na “nke a bụ maka nnabata nke onyeisiala Tinubu na-akwado mmemme mmepe akụ na ụba na atụmatụ ndị emere na Mọnde, abalị iri na otu  nke Septemba, dị ka Onye ndu Naijiria, Onye isi ala Tinubu weputara ogbo ya.”

Ọzọkwa, Onyeisiala Tinubu mekwara nke ọma n’ịkwalite usoro mmemme mgbanwe ego mba ofesi ọhụrụ n’etiti gọọmentị abụọ, nke a ga-ekwupụta nke ọma n’izu ndị na-abịa.

Onye isi ala Naijiria toro Onye isi ala UAE, Mohamed bin Zayed Al Nahyan, maka ọbụbụenyi na mbọ ya siri ike ijikọ aka na ya iji dozie ya kpamkpam na ịmaliteghachi ịdị mma, ụkpụrụ mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *