Take a fresh look at your lifestyle.

Ịfụ opi ‘Bagpipe’ a enyela m ohere ịzụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ma na-enye m ego ugbua – Chukwu Oba Kalu

0 332

Nwamadị aha ya bụ Chukwu Oba Kalu malitere ịrọ nrọ banyere ifu opi pụrụiche a kpọrọ ‘Bagpipe’ site na mgbe ọ dị na nwata.

Nrọ ya mechara bịa na mmezu mgbe ọ gbasiri mbọ ike mụta etu e si afụ opi a ka afọ ole ma ole gachara.

Ugbua ọ malitela ọrụ ikuziri ndị ọzọ, ọkachasị ndị ntoroọbịa etu e si afụ opi a.

Ọrụ ọma ya a nyere ya ohere izute aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ma kuziere ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa etu e si afụ opi a nke ha na-agbakwụnyezi na ngwa egwu ha.

Kalu kwuru na-agbanyeghi na mbọ niile ọ gbara banyere ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị chọrọ ịfụ opi a bụ ụlọ ọzụzụ National Piping Centre nke dị na Scotland, na ịṅụ ọkụ n’obi ya adajụghi kama na o fooro ntụtụ taa ịhụ na ọ mụtara ọrụ ịfụ opi a.

Maazị Chukwu Oba Kalu na-azụzị ọtụtụ ndị ntorobịa n’ọrụ ịfụ opi ‘Bagpipe’ ugbua

Maazị Oba Kalu onye gbara afọ iri ano na isii kwuru na ọ mere nchọpụta na e nwere ihe jịkọrọ opi ndị Igbo a na-akpọ ọja na nke a si mba Scotland a na-akpọ ‘Bagpipe’.

O kwuru na ihe dị iche na ha abụọ bụ na “Ndị ọcha chepụtara na a gaghi e ji ikuku si na ntị na-afụ ihe a mgbe ọbụla”

“Nke a mere ha jiri tinye n’akpa ya mere e ji na-akpọ ya ‘bagpipe’’

Maazị Kalu enyela ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ọzụzụ n’ọrụ ịfụ opi a dịka ha na-etinyezi ya na ngwa egwu ha

Maazị Kalu kọwara na obi ya ezigbo mma ịhụ na ọ na-agba mbọ ịhụ na ịfụ opi a bụ ihe garụrụ Naịjirịa niile mana naanị ihe na-echere ya aka mgba bụ na ọ dị ka ọ bụ naanị ya na-ebu ibu ifesa ngwa egwu a.

N’okwu ya ọ sị:

“E nwere ọtụtụ ndị ndorobịa chọrọ imụta ngwa egwu a ka ha si n’ime ya na-enweta ego”

“Nsogbu m na-enwe bụ na ọ bụ m na-enye ha ego ime njem nsogbo ọzọ bụkwa na ọ bụ na-azụtara ngwa egwu e ji eme ọzụzụ”.

Ọ gara n’ihu jaa ọha ume ka ha gbaa mbọ tinye anya n’ịmụta opi a maọbụ nwee ngwa ọrụ ha ji n’aka maka etu ọnọdụ ihe siri dị na Naịjirịa ugbua.

Ọ sị:

“Nke a bụ maka na agụụ dị n’obodo… Mmadụ agaghị enweeike gbochie agụụ ma enweghi ihe o ji n’aka ọ mụtara. Ịfụ opi a nke anyị ji dịka anyị na-eche onye mụta nke a, o jisie ya ike.”

Ka ọ dị ugbua, ọrụ a e meperela Maazị Kalu ụzọ dị iche iche nke gụnyere ị ga emume dị iche iche ebe a na-akpọ ya na ndị otu ya oku ka ha bịa fụọ ọpị a.

Emume ndị o kwuru a na-akpọ oku ka ha bịa gụnyere emume agbamakwụkwọ, akwamozu, ncheta ọmụmụ, ịchịgharị ọchịchị, mmeme ọdịnala nakwa emume dị iche iche

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *