Take a fresh look at your lifestyle.

Katsina : Nwunye Onyeisiala Naijiria Gara Leta Buhari

Timothy Choji dere ya na bekee

0 302

Nwunye onye isi ala Naijiria, Oluremi Tinubu na Tọọzde gara leta onyeisi ala n’oge mbụ, Mohammadu Buhari n’ụlọ ya na Daura, Katsina Steeti.

Oriakụ Tinubu, onye so na njem nleta ahụ bụ nwunye osote onye isi ala Nana Shettima kwuru na ọbịbịa a bụ ileba anya na onye isi ala mbụ wee kelee ya maka nkwado nna ọ na-aga n’ihu na-enye ọchịchị dị ugbu a.

O kpere ekpere maka ogologo ndụ, ezi ahụ ike na nkwado ndị ọzọ site n’aka ya ọ bụghị nanị maka ọchịchị nke Onyeisiala Bola Ahmed  Tinubu mana maka Naijiria dum. .

N’okwu ya dị nkenke, onye bụbu Onye isi ala, onye kwupụtara ekele, kwuru na nleta ahụ dị ịrịba ama.

“Dị ka unu niile na-ahụ, ọ bịara ileba m anya wee hụ na m na-eme nke ọma,” o kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *