Take a fresh look at your lifestyle.

APC Ahọpụtala Ganduje Ka Onyeisi Oche Paati

Aanya Igomu-Olagunju dere ya na bekee

0 350

Otu pati na-achị Naịjirịa bụ All Progressives Congress (APC) ahọpụtala aka chịrị Kano steeti n’oge gara aga bụ Abdullahi Umar Ganduje ka ọ bụrụ onyeisi oche ọhụrụ ya na Sinetọ Surajudeen Ajibola Bashir ka ọ bụrụ odeakwụkwọ otu paati ahụ.

Emere nhọpụta nke onye isi oche na onye odeakwụkwọ na Tọọzde na nzukọ nke iri na abụọ ya nke APC National Executive Committee n’Abuja, isi obodo Naijiria.

Ganduje na Sinetọ Bashir nọchiri onye bụbu onyeisi oche paati ahụ, Abudullahi Adamu, na odeakwụkwọ ya, Iyiola Omisore, bụ onye gbara arụkwaghịm n’izu ole na ole gara aga.

N’okwu nnabata ya, onyeisi oche APC ọhụrụ bụ Sinetọ Ganduje kwuru na ọ ga-elekwasị anya n’ịkwalite ịdị n’otu pati na ịbawanye ọnụ ọgụgụ ndị gọvanọ steeti na ndị omebe iwu na pati ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *