Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ọgbaghara na-ada n’ahịa Ogbete Enugwu steeti

0 320

Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n’ahịa Ogbete dị n’Enugwu nupụtara n’igwe n’ụtụtụ Wednezde 26 Julaị 2023 na-eme ngagharịiwe maka mgbachi gọọmentị steeti ahụ gbachiri ụlọahịa ha kamgbe ụbọchị Mọnde 24 Julaị.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị gbachiri ụlọahịa ụfọdụ ndị mmadụ maka na ha rubereisi n’iwu ịnọ n’ụlọ na-ekweghi agbape ahịa ha n’ụbọchị Mọnde.

Cheta na gọvanọ Peter Mbah nyere iwu dịka ọ banyere n’ọchịchị sị ka a kwụsị ịnọ n’ụlọ ma sị a ga-agbachi ụlọahịa, ụlọọrụ ndị mere nke a.

Ụfọdụ ndị nke a metụtara malitere ime ngagharịiwe na-akpọ oku ka gọọmentị gbapee ụlọ ahịa na o nweghi ihe ọjọọ ọbụla ha mere.

N’ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, ụfọdụ ndị a na-eme ngagharịiwe kwuru na o nweghi ihe gbasara gọọmentị ma ha nọrọ n’ụlọ n’ụbọchị Mọnde agbapeghi ụlọahịa ha.

Ihe onyonyo ọzọ na-efegharị kwuru na a gbagbuola otu onye ntoroọbịa n’oge ngagharịiwe a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe kwuru na ọ bụ eziokwu na ọgbaghara dapụtara n’Ogbete kama na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gara ebe ahụ ime ka udo chịa.

O kwuru na ọ enweghi ozi ọbụla banyere onye a sị na a gbagburu n’Ogbete ebe ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *