Iji asụsụ Igbo eme ihe onyonyo ahụike.
Dọkịnta Ogechi Eze, bụ onye a ma ama na soshal midia maka iji asụsụ Igbo akụzi ọtụtụ ihe gbasara ezi ahụike maka ụmụnwaanyị.
Onyonyo ya na-efesa ebe dị icheiche dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-eziga ha nye ndị nne ha nakwa ụmụnne ha bi n’ime obodo n’ihi na ha na-aghọta ya nke ọma karịa nkọwa ahụike ndị nke e mere na bekee.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n’ọdị nso a, Dkt Eze kwuru na ‘asụsụ dị mkpa maka na ọ na-enye aka ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-akọwara ha, mụta ya nke ọma, ma nwekwaa ike icheta ha n’ọdịnihu”.
Eze kwuru na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịhụ na ndị Igbo mụtara asụsụ ha ma ghọta maka ahụike ha n’ụzọ doro anya karịa iji nnukwu bekee bụ nke na-agbagwoju onwe ha anya.
Ọ kọwara na ihe onyonyo ọ na-eme abụghị na ọ dịrị ya mfe, makana o nweghị igwe e ji ese onyonyo, kama nke ahụ egbochighị ya iji ekwentị ya esete ya bụ onyonyo.
BBC IGBO.
Leave a Reply